Iwu mgbanwe

Ị nwetugo mgbe ị na-eche ihe kpatara mpụta ụwa ji na-apụghi enye anyi aṅuri adịghị akwụsi akwụsi.

Azịza ya bụ, mpụga ụwa anaghị adịgide – o nwere otu ihe na-adịgide na mpụga ụwa, ihe ahụ bụ MGBANWE.

N’ịmatụ: O nwere ike ọ bụrụ na ị hụrụ aka ọlụ ọfụụ Ị nwetara ụgbụa n’ anya, chọpụta na ọ na-abawanye ma na-akwalite mmasi. Ma gini ga- eme ahọ ole na ole na-eso mgbe Ị rụrụ ọlụ a ugboro ugboro ma ọbụ nwe mgbanwe na ndi ọlụ gi, biakwa na- anaghị enwe obi ụtọ na nnọkọ ndi ọfụụ gị na ha na-alụ ụgbụa? Mpụga ụwa nọ na mgbanwe mgbe ọbụla – n’ihe ya enweghi ike inwe aṅuri na-adịgide ebebe n’ebe ahụ.

Kita, ọ bụrụ na anyi chọrọ aṅurị na- adigide ebebe, anyi ga-etinye onwe anyi n’ihe na-adịghị agbanwe agbanwe na nke di ebịghị ebị. Mkpụrụ obi nọ n’ime anyi bụ agbanwe agbanwe na ebịghị ebị. Mana ọ bụrụ na anyi etinye onwe anyi na ihe na-agbanwe agbanwe ka chi si kee ya, mgbe ahụ otu ahụ ka ụdị aṅuri anyi ga-enweta ga-adi-nwa mgbe nta na-adịghị adịgide.