Ihe n’eme eme na ndụ

Ihe n’eme eme na ndụ

Nnyoko e ji achọpụta ihe n’eme na ime mụọ gosiri na n’ ime uwa nile, e ekee oge ụzọ nnari, mmadu na anọ n’aṅuri mgbe nile oge iri atọ, ebe ọ n’anọ n’iwe na oge iri anọ. Oge iri atọ fọrọnụ, onye ahụ nọ na etiti, ọ nọghị n’aṅurị,ọ nọghikwa n’iwe. N’ imatụ, mgbe mmadu na-aga na ụzọ ma ọbụ na-eme ihe o jighị oke uche eme ya na mgbe ọ naghi eche echiche maka aṅuri ma ọbụ iwe.

Otu ihe so n’ akpata ịnọkarị n’iwe na ndụ anyi bụ udi nkuzi anyi nwere. Udi nhazi nkuzi e debere bụ nke na akuziri ụmụ akwụkwọ ọtụtụ ihe di iche iche, mana, ọ naghị akuziri ha ihe gbasara aṅuri di ebebe. Akuzighi anyi n’ụlọ akwụkwọ etu anyi ga esi na enwe aṅuri n’agbanyeghị ọnọdụ ọbụla anyi nwetara onwe anyi na ndu.

I ga enweta nwa okorobia nwere ezigbo aka ọlụ a hụrụ anya, mana o enwetu ihe ọghọm na aka na ụba ya ọnụma eju ya obi o chebe echiche igbu onwe ya. I ga enwetakwa nwanyi eji ama atụ n’ụlọ ọlụ ya maka oke mbọ ọ na agba iji kwalite  otu ya, mana ọ na enwe nmegbu na aka di ya bụ onye nke na eletu ya anya, na emekwa ya obi ezughi ike na enchekasị.

Mmadụ na agụsi akwụkwọ ike bia lele ọtụtụ ule ka o wee nwe isi mbido na ndụ, ka o wee nweta ezigbo aka ọlụ ọ ga eji we bie ndụ ka ọ chọrọ nke ga-eme ka ọ nọro n’aṅurị.

Mana anyi ana achọ ya n’ụzọ kwesiri ekwesi? Ọ bu ọlụ aka n’ezịa ga-enye anyi aṅuri? i nwe di, nwunye m’ọbụ ụmụaka ọ ga- eme ka anyi na anọgide na aṅuri? N’agbanyeghi na ndi mmadụ chọrọ ịnọ n’aṅuri, anyi chọpụtara na iwe n’enye ndi na agughi akwụkwọ nsogbu di ka o si n’enyekwa ndi guru nukwu akwụkwọ nsogbu.

Yabụ ọ dika anyi aga atụle ụzọ ọfụụ ga anyi ga esi n’enwe anuri n’adighi akwụsị akwụsị n’agbanyeghi ọnọdụ ọbụla anyi nọ n’uwa.

Ụgbụa ụfọdụ n’ime ụnụ ga na eche, “echeghi m na nkea bụ maka m, ebe m bukwa onye anuri.”

Maka onye di otua, anyi n’ekwu na ihe edemede a bu maka gi site na ụzọ ihe atọ a :

  • Ndụ na-agbanwe agbanwe oge nile, onweghị ihe n’adigide. I nweghi ike ikpebi na ndụ gi nile ga-adigide ka ọ di ugbua n’enweghi ngbenwe ọbụla – di ka ọnọdụ aka ọlụ gi,ọnọdụ akụ n’ụba gi, ezi na ụlọ gi ya na ndi enyi gi ma ọbụ ikwu na ibe gi.
  • I tosiri imuta ka I ga esi kwado onye gi  etu ga enyere gi aka ikwudo si ike n’ime mụọ gi iji lụọ ọgụ n’oge ihe isi ike.ebe ọbụ na ọdịghị onye ma mgbe ndụ ya ga-eme ntughali weta ihe adighi mma na ọnọdụ ndụ ya.
  • E kwuru si, “ echela ka i gwuo ụmị mgbe akpiri na- akpọ gi nku, kama gwuo ya n’oge tupu akpiri akpọ gi nku, ka i wee enwe mmiri iga aṅu.”