Abstract Ihe ọmụma
Ọ bụ ihe inye ekele na ọkammụta (sayensị) nke ịgụ kpakpando nwere ike ịghọta ụdị ụwa dị omimi na akara aka nke karịrị ọmụma nke ọkammụta ugbu a. Site na usoro nyocha ime mmụọ anyị chọpụtara na iziezi nke ịgụ kpakpando bụ ọ kacha iri atọ%. Izi ezi na ike nke nkọwa nke onye na agụkpakpando nwere ike mụbaa naanị site na omume ime mmụọ.
Contents
- 1. Okwu mmalite iziezi nke ịgụ kpakpando
- 2. Banyere ịgụ kpakpando
- 3. Arụmụka sayensị nke ugbu a megide ịdabere na izi ezi nke igụ kpakpando
- 3.1 Kedu maka nnwere onwe ime nhọrọ?
- 3.2 Enweghị nhazi na nkọwa
- 3.3 Nnukwu mkpokọ ọnụ
- 3.4 Anaghị eji mbara ala niile eme ihe
- 3.5 Ngbanwe ọnọdụ njikọ kpakpando
- 3.6 Ihe ndị ọzọ na emetụta ịmụ nwa.
- 3.7 Gịnị kpatara eji atụle oge ịmụ nwa kama ịturụ ime mgbe a na-esepụta eserese maka ịgụ kpakpando?
- 3.8 Akaebe ọnụ ọgụgụ
- 4. Ụfọdụ okpukpe jụru ịgụ kpakpando
- 5. Echiche ime mmụọ banyere izi ezi na ntụkwasị nke ịgụ kpakpando
- 6. Na nchịkọta
1. Okwu mmalite iziezi nke ịgụ kpakpando
Site na mgbe ochie, echiche ahụ na ihe ndị dị na mbara igwe nwere ike inye nkọwapụta ọdịnihu na-adọrọ mmasị ụmụ mmadụ. Ịhụnanya mmadụ na ịgụ kpakpando na- ebido na nlele anya nkịtị na ngalaba akwụkwọ akụkọ mgbaama zodiac ruo na-ime mkpebi dị mkpa na ndụ dị ka alụmdi na nwunye, ego na ọbụna ọgwụ na ndụmọdụ nke ndị na-agụ kpakpando. Ọ maara na ụfọdụ ndị isi obodo chọkwara ndị na-agụ kpakpando ka ha nyere aka mee mkpebi ndị nwere ike imetụta akụkọ ihe mere eme.
Ya mere olee izi ezi nke ịgụ kpakpando mgbe ejiri ya dị ka ngwa ọrụ iji buo amụma ma ọ bụ maka ime mkpebi? Anyị jiri usoro nyocha ime mmụọ iji nye aka n’inweta ihe omuma banyere ajụjụ a yana inyekwa echiche ime mmụọ maka izi ezi nke ịgụ kpakpando na ihe ndị nwere ike imetụta ya.
Ihe na-adọrọ mmasị banyere astrology bụ na ndị na-agụ kpakpando na-agbalị ịghọta akara aka nke ndị mmadụ dabere na ndekọ pere mpe dị ka oge a mụrụ na ohere na ogologo oge nke ebe a mụrụ. Ndị na-agụ kpakpando na-agba mbọ inye ihe banyere akụkụ ụfọdụ nke ndụ mmadụ dị ka kpakpando na-akpata ọrịa ụfọdụ ma ọ bụ ihe isi ike, dịka enweghị ike ịlụdi/nwunye, oge kachasị mma ịmalite ịzụ ahịa ma ọbụ ihe ọ bụla ọzọ nke onwe na okwu mba.
Dị ka ndị sayịesị nke ime mmụọ, akara aka bụ akụkụ ndụ anyị nke amara ọbụladị tupu amụọ anyị. Omume ukwuu nile na ndụ anyị bụ nke edegoro dị ka nne na nna ga amụ anyị, onye anyị ga-alụ ma ọ bụ ọrịa na-egbu egbu anyị nwere ike inwe. Akara aka bụ okwu ime mmụọ ebu pụta ụwa nke ahụ uche ise, uche na ọgụgụ isi enweghị ike ịghọta.
Ezi okwu na ndị na-agụ kpakpando na-ekwu na ha nwere ike ịkọ ihe ga-eme na ọdịnihu maka akara aka anyị site na sayensị kpakpando na ntakịrị mmetụta ihe chọrọ ime n’ọdịnihu1 nwetara mmasị anyị ya mere anyị ji kpebie ịnyocha usoro ọmụma nke a.
2. Banyere ịgụ kpakpando
2.1 Gịnị bụ ịgụ kpakpando?
Anyị chọpụtara na-enwere ọtụtụ nkọwa nke ịgụ kpakpando dabere na nghọta nke ndị mmadụ maka isi okwu a. Ha bụ:
Ịgụ kpakpando bụ usoro ihe ọmụma bụrụ ibụ ma enwere ọtụtụ ngbakọọ ọnụ na-agbagoju anya dabere n’ọnọdụ nke kpakpando na mbara ala na mmekọrịta dị n’etiti ha na ọtụtụ ihe omume na-eme n’ụwa gụnyere ndụ ụmụ mmadụ. (Ref: vedic.indastro.com, 2006)
“Ịgụ kpakpando enyeghị nkọwa nke iwu eluigwe na ala, ma ọ bụ ihe kpatara eluigwe na ala ji dị. Ihe o na-eme, itinye ya n’okwu dị mfe, bụ igosipụta na enwere mmekọrịta n’etiti nukwu ihe okike na obere ihe okike. Na nkenke na eluigwe na ala nwere ụda, na ndụ mmadụ na-esonye na ụda nke a” (Henry Miller – Ref: elore.com, Feb 2006)
Ịgụ kpakpando bụ ihe omume mgbe ochie nke na-ewere ya na ọnọdụ nke kpakpando na mbara ala nwere mmetụta ọ na-enwe na ndị mmadụ na ihe omume. Ka ewere ya, na enwere ike ihazi usoro obibi ndụ mmadụ site na ịchọpụta ọnọdụ nke kpakpando na mbara ala n’oge amụrụ onye ahụ. Ihe ndepụta a na-agbalị imezu nke a ka a mara dị ka ihe inyo akara aka (horoscope) (Ref: greatcom.org)
Ụfọdụ ahịrị okwu ndị anyị na-ahụkarị bụ:
Mmekọrịta dị n’etiti ọnọdụ nke kpakpando na mbara ala na ihe omume dị ịtụnanya n’ Ụwa gụnyere ndụ ụmụ mmadụ.
E nwere mmekọrịta n’etiti nnukwu ihe okike na ihe okike ntakịrị.
Ọnọdụ nke kpakpando na mbara ala nwere mmetụta na mmadụ na ihe ndị na-eme eme.
Na-agbanyeghị na-enwere ihe dị iche iche na nkọwa nke ịgụ kpankpando enwere nkwekọrịta na inyo akara aka ọ bụla, oge ọmụmụ bụ mmalite dị mkpa, ya na ebe anọrọ mụọ (ohere na ogologo nke ebe a mụrụ nwa).
2.2 Kedu ka esi eji igu kpakpando eme ihe?
Site na nyocha anyị chọpụtara na enwere ọtụtụ ụdị ịgụ kpakpando na ihe eji ha eme gụnyere:
Ihe eji ya eme ma ọ bụ Ihe ọ na-arụ | Ihe ọ pụtara |
---|---|
Amụma | Iji mata banyere ihe ga-eme n’ọdinihu |
Ịchoputa nsogbu | Ime ihe dika enyemaka iji dozie nsogbu ahụike siri ike ma o bu maka nke ahụ ịghota isi ihe na-akpata nsogbu na-emetuta akuku obula nke ndu. N’imatu, mmadụ nwere ike iju onye na-agu kpakpando ajuju banyere ihe mere o ji na-enwe nsogbu ego akwusi akwusi na-agbanyeghi na-o na-akpata ezigbo ego. |
Ọdịdị zuru oke na ndakorita | Ighota ụdịrị mmadụ na ndakorita yana oru o na-arụ ma o bu onye ya na ya ga-ebi n’ndu dabere na mgbama zodiac ma o bu ihe ndekọ inyo akara aka (horoscope) nke onye obula n’ime ha. |
Ime mkpebi | Nke a gunyere ima oge a guputara di mma maka ememme di ka alum di na nwunye ma o bu mmemme imeghe azụmahịa mmadụ ma o bu iza otu ajuju di ka oge mmadu kwesiri ilu di/nwunye. |
N’ikpeazu n’ime ngalaba nke ụzọ ime mmụọ anyị enwere n’ụjụ banyere izi ezi nke ijiri ịgụ kpakpando na-eme ihe.
Ọzọkwa ọ dị mkpa igbakwunye dabere na onye anyị na- gakwuru maka enyemaka iji dozie nsogbu anyị, ụzọ isi nyocha ihe kpatara nsogbu ndị ahụ ga-adị iche. Enwere amaokwu Sanskrit (na asụsụ ochie ndị India) nke kwụrụ na n’ọnọdụ isi ike ọ bụla:
Ọ bụrụ na mmadụ jụọ onye na-eme sayensị nke Āyurvēda, ya bụ a vaidya (Ayurvedic dọkịta), ọ ga-ekwu na ọ bụ n’ihi anọzịghị anọzi n’etiti nke ihe atọ ndị dị na ahụ iligili, ukwara na ikuku (bile,phlegm and wind) .
Ọ bụrụ na mmadụ jụọ onye na-agụ kpakpando ọ ga-ekwu na ọ bụ n’ihi otu ọnọdụ nke kpakpando na mbara ala.
Ọ bụrụ na mmadụ jụọ dibịa oyibo ọ ga-ekwu na ọ bụ n’ihi ọrịa na-emetụta akụkụ ahụ ụfọdụ.
Ọ bụrụ na mmadụ jụọ onye si na mmụọ ọ ga-ekwu na ọ bụ n’ihi akara aka.
Yabụ kedu nchọpụta a ga-ekwenye?
Dị ka sayensị nke Ime Mmụọ, azịza ya bụ na ha niile bụ eziokwu, n’ihi na azịza ndị a abụghị naanị otu ma ọ bụ dị iche na ibe ha mana ọbụ naanị ụzọ dị iche iche nke ikwupụta otu eziokwu n’eso ihe isi ike nke dabere na ebe a na-ekwu akwụkwọ ya. Dịka ọmụmaatụ, ihe a ga-eme dị ka akara aka onye e nwere ike ịkọwa ya n’okwu nke ọnọdụ nke kpakpando na mbara ala.
3. Arụmụka sayensị nke ugbu a megide ịdabere na izi ezi nke igụ kpakpando
Nkwa nke nkọwa nke ịgụ kpakpando enyere n’elu na nkebi nke abụọ nke mbu, ya bụ, inwe ike ịkọ ihe ga-eme n’ọdịnihu enwetachabeghị ohere ọ bụla. Otu ọdị o nwere mmegide siri ike site n’ụfọdụ okpukpe na sayensị nke oge a banyere ịdabere na izi ezi ya. Sayensị nke oge a na-ezo aka na ịgụ kpakpando dị ka adịgboroja ma ọ bụ sayensị ezighị ezi.
Site na nyocha e mere, anyị chọpụtara ọtụtụ ihe mgbochi ndị megidere ịgụ kpakpando. Ụfọdụ n’ime isi ihe arụmụka nke sayensị nke oge a megidere izi ezi na ịdabere na ịgu kpakpando gụnyere:
3.1 Kedu maka nnwere onwe ime nhọrọ?
Ọ bụrụ n’ọnọdụ nke mbara ala ( nnukwu), na emetụta na-emepụta mmeghachi omume kwekọrọ na mmadụ ( obere), nke a na-eme mmadụ ka ọ nọ na mbara igwe, jiri ndụ ya na omume ya bụrụ ụzọ kpebie na enweghị mgbagha. Kedu maka nnwere onwe ime nhọrọ na inwe ike ịchọpụta ọdịnihu mmadụ?
N’ụzọ ime mmụọ: Biko jee na nkebi nke 5.1 banyere n’ụzọ ime mmụọ gbasara nnwere onwe ime nhọrọ.
3.2 Enweghị nhazi na nkọwa
E nwere ọtụtụ usoro nke ịgụ kpakpando nke ọ bụla nwere ụzọ nke aka ha na-emegide ibe ha. Enweghị otu olu na nhazi nke nkọwa. N’ịmaatụ, ndị na-agụ kpakpando n’ebe ọdịda anyanwụ agaghị akọwapụta ihe ọdịnihu n’otu ụzọ ahụ dị ka onye China na-agụ kpakpando.
Ode akwụkwọ SSRF: A na-arụrịta ụka na otu usoro nkọwa abụghị okwu ahụ. Ihe a chọrọ ma dị mkpa ebe a bụ eziokwu ma amụma ha abụ otu.
3.3 Nnukwu mkpokọ ọnụ
Ọtụtụ amụma banyer omume na akparamagwa ka a na-ekpokọ ọnụ nke na ọ ga-esiri ha ike ka ọ ghara ịbụ na ọ dịkarịa ala o ziri ezi.
N’ụzọ ime mmụọ: Biko jee na nkebi 5.4 maka ụzọ ime mmụọ banyere izi ezi.
3.4 Anaghị eji mbara ala niile eme ihe
Ndabere nke ịgụ kpakpando gbasara ọnụ ọgụ nke mbara nọ na usoro ikpo ọkụ anyị . Ma ọtụtụ ihe eserese ịgụ kpakpando dabere n’echiche na enwere mbara asaa dị na usoro ikpo ọkụ anyị (gụnyere anyanwụ na ọnwa). N’oge ochie, ejighị anya efu ahụ Uranus, Neptune na Pluto. N’ihi nke a, ndị na-agụ kpakpando dabere usoro ha na mbara asaa nke ha kwenyere na ha na-aga ụwa okirikiri. Site na oge ahụ, egosiri na anyanwụ, ọ bụghị ụwa, bụ ebe etiti nke usoro ịkpo ọkụ, na mbara atọ ndị ọzọ dị na usoro ịkpo ọkụ anyị. Dị ka okwu ndị na-agụ kpakpando si dị (na ọnọdụ nke mbara ala nwere otu mmetụta na omume ụmụ mmadụ na ihe ndị na-eme eme), Mbara atọ ndị achọpụtaghị na mbu kwesikwara imetụta omume, ma ekwesiri ịtụle ya maka ezigbo ihe nlere a ga-atọghe. A naghị atụle ha mgbe nile, ya mere okwu ịgụ kpakpando na-agbaji, maka na ihe nlere ezighị ezi enweghị nke edepụtara na-elebaghị anya na mabara ndị ọzọ niile na mmetụta ha nwere ike inwe.
Ode akwụkwọ SSRF: Enwere ihe akaebe iji gosi na omenala dịka Vēdic Astrology dịrị ọtụtụ puku arọ tupu mgbe ahụ na ọbụna n’oge ahụ enwere nghọta miri emi banyere ịgụ kpakpando na eziokwu dịka ọ dị n’elu. Biko jee na nkebi 5.3
3.5 Ngbanwe ọnọdụ njikọ kpakpando
Ịgụ kpakpando abụghị sayensị n’ihi eziokwu nke iganihu ma ọ bụ mgbanwe ọnọdụ njikọ kpakpando. Ndị mbu na-enyocha mbara igwe amataghị banyere ịganihu, ya mere etinyeghị ya na usoro ọrụ ha. Akara iri na abụọ nke zodiac bu ụzọ kwekọọ na njikọ kpakpando iri na abụọ nke otu aha. Otu ọ dị site na ịganihu, njikọ kpakpando ndị a agbanwela n’ọnọdụ ha na puku afọ abụọ gara aga. Nke a pụtara na njikọ kpakpando nke Virgo nọzị ugbu a na akara nke Libra, njikọ kpakpando nke Libra nọzi ugbu a na akara nke Scorpio ma dịrị gaba.
Ode akwụkwọ SSRF: Enwere ihe akaebe iji gosi na omenala dịka ịgụ kpakpando n’ụzọ Vēdic dịrị ọtụtụ puku afọ tupu mgbe ahụ na ọbụlagodị n’oge ahụ enwere nghọta miri emi banyere ịgụ kpakpando na akụkọ eziokwu dị ka nke a dị n’elu. Ha mara ya ma tinye ya na usoro mgbakọ ha mgbanwe ọnọdụ a mgbe ha wepụtara ya. Biko jee na nkebi 5.3
3.6 Ihe ndị ọzọ na emetụta ịmụ nwa.
Ịgụ kpakpando na-eleghara ike ndọtụlata ala ndị ọzọ nke na-esonyeghị na akụkụ ihe ndị na-ekpo ọkụ n’ịmaatụ, ndọta nke ndọda site na aka nke ndị na-eji ime na nwa amụrụ ọhụrụ dị ihe dị ka ụzọ isii karịa nke Mars. (Ref: Hugh Ross, Ph.D)
Ode akwụkwọ SSRF: Otu ndị na-enyocha ihe ime mmụọ nwere ọtụtụ ndị dibịa oyibo ndị na-eme omume ime mmụọ n’okpuru nduzi ya. Ka ha kwadoro nkwupụta ahụ na mmetụta nke ike ahụrụ anya ndị na-eji ime na- adọ dị ọtụtụ oge karịa ike nke ndọda nke Mars, ha na-arụka na ọ dị ukwuu karịa ụzọ isii dị ka Hugh Ross kwuru.
N’ụzọ ime mmụọ: Ndị na-agụ kpakpando na-ewekarị mmetụta nke mbara ala dị ka ịhe dị ịrịba ama. Mana ịgụ kpakpando ọ bụ banyere mmetụta nkịtị nke mbara ndịa ka ọ bụ bayere ọnọdụ ihe ndị nọ na mbara ala nke na-arụ ọrụ dị ka okporo ụzọ nke akara aka anyị? Jee na nkebi 5.2
3.7 Gịnị kpatara eji atụle oge ịmụ nwa kama ịturụ ime mgbe a na-esepụta eserese maka ịgụ kpakpando?
Ihe nlere inyocha akara aka dabere na ihe esepụtara na eserese kpọkwem: isi okwu bụ oge ịmụ nwa. Otu ọ dị gịnị kpatara eji ewe oge a na-abụghị oge ịtụrụ ime? Ndị ọka mmụta sayensị kwenyere ugbu a na ọtụtụ akụkụ nke agwa nwatakịrị ka edobere ogologo oge tupu a mụọ ya – ya mere nlere akara aka kwesịrị iburu n’uche ndụ tupu a mụọ ya.
N’ụzọ ime mmụọ: Oge itụrụ ime kpọkwem siri ike ịchọpụta, otu ọ dị ọ bụrụ na ihe nlere inyocha akara aka na e sepụtara ya tupu amụọ nwa, ọ ga-enwe nkọwa ziri ezi karịa. Biko jee na nkebi 5.5.5 maka ịmatakwu ihe ọmụma.
3.8 Akaebe ọnụ ọgụgụ
Kemgbe ọtụtụ afọ, enweela ọmụmụ ọnụ ọgụgụ dị iche iche e mere na-agbalị iji nwapụta izi ezi nke ịgụ kpakpando. Astrology-and-science.com na-ekwu nnwale nke gụnyere ọtụtụ eserese nke ịmụ nwa nwere nkọwa nke ndị nwe ha. Ọrụ ndị na-agụ kpakpando bụ ime nkwekọrịta eserese ahụ na ndị nwe ha.
“N’akwụkwọ ịgụ kpakpando ha na-eme ya oge niile” Ha kwụrụ “ya bụ anyị na-atụ anya ogo nkwekọrịta na-aga nke ọma iji kpoo ihe ruru otu nnarị%. Ruo taa, ngụkọta nke ọmụmụ dị iri ise na anọ mere nnwale a site na iji ngụkọta nke ndị na-agụ kpakpando dị nnarị asaa na iri anọ na abụọ na eserese ịmụ nwa dị otu puku, nnarị anọ na asaa. N’agbanyeghị ọnụ ọgụgụ a na-adoro mmasị ogo ihe ịga nke ọma adịghị iche na iri ise% atụrụ anya na ndabara, na ọ bụ adịghị mma karịa ịtụgharị mkpụrụ ego.”
Ode akwụkwọ ndị SSRF: A na-arụ ụka na ọ bụrụ na ọbụna otu onye na-agụ kpakpando nwetara ya nke ọma na mgbanwe dịgasị iche iche na ndụ mmadụ dịka ọkwa ego, ọnụọgụ ụmụaka, akparamagwa mmadụ, atụmatụ alụm di na nwunye, azụmahịa, ọrịa, na ihe ndị ọzọ ga, ọ ga-abụ ihe ịja mma dị ka enwere ike inweta ya nke ọma site na ime ọtụtụ mgbanwe ga-adị obere.
4. Ụfọdụ okpukpe jụru ịgụ kpakpando
Okpukpe ndị a di ka ndị otu Kraịst na-ajụ ịgụ kpakpando kpamkpam n’ihi ihe ndị a:
Website nke onye otu Kraịst absolutetruth.net na-ekwu na Akwụkwọ Nsọ katọrọ nke ukwuu ịgụ kpakpando, na ihe ọ dị ka ya bụ ịta amosu na otu nzuzo. Ọ na-ekwu, “Ọ bụrụ na ihe kpatara echiche nke ịgụ kpakpando bụ eziokwu, na ọnọdụ nke kpakpando na-enwe mmetụta, na-ekwu ọdịnaihu ma ọ bụ n’ụzọ ọ bụla na-ekpebi ihe omume ụmụ mmadụ, tụlee ụfọdụ ihe ọ pụtara”
> “Ọ bụghị ụmụ mmadụ ga-aza ajụjụ maka omume ha ma ọ bụ ịhe ọma ma ọ bụ ịhe ọjọọ. O enweghị ihe ndabere ọ bụla a ga-eji kpee omume ọ bụla ‘na izi ezi’ ma ọ bụ ‘na ezighị ezi’ ọ bụrụ na a manyere onye ahụ ime omume ahụ n’ihi ụfọdụ ndakọ ihe ndị dị n’ụwa.”
N’ụzọ ime mmụọ: Dika sayensị ime mmụọ nke a abụchaghị ezie. Biko jee na edemede isi okwu iwu ime mmụọ nke inye-ma-inara nke na-egosi iwu na-eso “mkpụrụ ị kụrụ ka ị ga-aghọrọ”
> “Nhọrọ anyị ga-abụ ihe efu. Ọ bụrụ na enwere ike ikọ ọdịnihu site na ngagharị mmegharị nke mbara ala na kpakpando, na-egosi na anyị na-ebi naanị nrọ nke ikike ikpebiri onwe anyị, mgbe ahụ ihe ọ bụla anyị na-eme ma ọ bụ na-agaghị eme ga-aba uru obere. Anyị ga-adaba na ‘ọnya’ nke ‘akara aka anyị’.”
N’ụzọ ime mmụọ: Dika sayensị nke ime mmụọ, Idị adị nke akara aka bụ ezigbo eziokwu, mana anyị nwere ike iweri akara aka anyị ma ghara ịnọ n’ọnya ya. Jee na nkebi nke 5.1 na isi okwu edemede nke etu eji emerị akara aka.
> Mgbanwe-ndụ, otu isi ihe dị n’ime Akwụkwọ Nsọ, agaghị ekwe omume n’ihi na ịgụ kpakpando kwuru na ndụ anyị ga-abụ ihe edobere na otu ụsọro mgbe amụrụ anyị.
N’ụzọ ime mmụọ: Mmadụ nwere ike ịganihu na ime mmụọ ọbụladị na o nwere akara aka ọjọọ.Jee na nkebi nke 5.1 na isi okwu nke otu esi aghọọ ezigbo mmadụ site na ime omume ime mmụọ, Ụrụ nke Omume Ime Mmụọ”.
>Ndị otu Kraịst kwenyere na ike ime mmụọ mmụọ ọjọọ nwere ike ịchịkwa ihe omume nke ndụ ndị mmadụ ndị meghere onwe ha nye mmetụta ndị otu nzuzo, dika ịgụ kpakpando na inyo nlere akara aka. Akwụkwọ nsọ nwere ịdọ aka na ntị sịrị ike metụtara nke a.
N’ụzọ ime mmụọ: Ike mmụọ ọjọọ dika ndị mmụọ (ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma, na ndị ọzọ ga.) nwere ike imetụta onye ọ bụla ọbụlagodị ma ha dị asọ. Ha achọghị onye na-ajụ ase di ka ịgụ kpakpando dụghie onye ọ bụla. Ụkpụrụ bụ na ka ọkwa ime mmụọ mmadụ dị elu ka onye ahụ na-emekwu omume ime mmụọ, na enwekwu nchekwaba site na mmetụta nke ndị mmụọ (ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma, na ndị ọzọ ga.). Ọtụtụ ndị mmadụ n’oge a na-agbanyeghị okpukpe nọ n’ọkwa ime mmụọ iri abụọ%. Ya mere ha nwere obere ikike nke ime mmụọ, nke a mere na ha enweghị nchebe megide ndị mụọ (mmụọ ọjọọ, ekwensu, ike adịghị mma, na ndị ọzọ ga.) Jee na nkebi anyị nke ndị mụọ (mmụọ ọjọọ, ekwensu, ike adịghị mma, na ndị ọzọ ga.)
5. Echiche ime mmụọ banyere izi ezi na ntụkwasị nke ịgụ kpakpando
Ndị a na-esonụ bụ ụfọdụ isi ihe anyị nwetara n’oge usoro nyocha ime mmụọ anyị nke ga-eme ka anyị ghọta ịgụ kpakpando dị ka usoro ihe ọmụma na izi ezi ya.
5.1 Nnwere onwe ime nghọrọ ole ka anyị nwere n’ezie na ndụ anyị?
Dị ka sayensị nke ime mmụọ, Na nkezi, na oge a iri isii na ise% nke ndụ anyị bụ akara aka na-achi ebe iri atọ na ise% bụ site na omume ama ụma na-eme (nnwere onwe ịhọrọ). Akara aka bụ akụkụ nke ndụ anyị ebe anyị enweghị ike ịchịkwa ọnọdụ ndụ. Omume ime uche nhọrọ bụ akụkụ nke ndụ anyị nke anyị nwere ike ịchịkwa.
Ịgụ kpankpando nwere ike naanị ịghọta ruo n’oke ụfọdụ ihe dị na akara aka mmadụ na otu onye ahụ ga-esi na-eme ihe ọ ma ụma na-eme dabere na ọdịdị ya. Ọ bụ ezie na mmadụ enweghị ike iwepu akara aka ọbụlagodi na ọ maara ya. Ọtu ọ dị ebe akara aka bụ ihe ebumpụta ime mmụọ ọ bụ site naanị na mmụọ ka a ga-eji meri ya, ya bụ site na omume ime mmụọ ma ọ bụ amara nke onye Guru (Ndu) (ya bụ Onye isi na-edu n’ime mmụọ nwere ọkwa ime mmụọ karịa iri asaa%).
Kedu uru ọ baara anyị ma ọ bụrụ na anyị mara ogo ịdị njọ nke akara aka anyị?
Na ima ogo ịdị njọ nke akara aka anyị, anyị nwere ike ime omume ime mmụọ dakọrịtara na ogo ahụ iji merie ya kpamkpam ma ọ bụ nwe nchekwaba site na ya. N’ihe banyere akara aka dị oke njọ, ọ dịkarịa ala anyị nwere ike ibu ụzọ nweta ịdọọ aka na ntị na uche ịdị njikere. Biko jee na eserese dị n’okpuru maka ụdị akara aka na ụzọ iji emerie ya.
Ụdị Akara aka
dị Ntakịrị | Agafeghị oke | Siri ike | |
---|---|---|---|
Atụmatụ | Ndị obere ọrịa, mgbalị ndị mmadụ na-eme iji kwado alụmdị na nwunye karịrị akarị | Nsogbu di na nwunye, mfu ego, enweghị ike ịmụ ụmụ aka | Nnukwu ihe ọghọm na ọnwụ mberede, enweghị ike ịhazi alụmdị na nwunye n’agbanyeghị nnukwu mgbalị |
Otu esi emeri? | Omume ime mmụọ na-agafeghị oke | Omume ime mmụọ miri emi | Enweghị ike iji omume ime mmụọ gbanwe ya. Naanị amara nke onye Guru (Onye ndu) nwere Ike ịgbanwe ya |
Biko rụba ama:
Omume ime mmụọ miri emi n’ụdị ibu ga-apụta ihe dịka elekere iri na abụọ ruo elekere iri na anọ nke omume otu mbọchị. N’ụdị ịdị mma, ihe ọpụtara bụ na onye ahụ na-eme omume ya niile ụbọchị dị ka ijere Chineke ozi, yana oke agụụ nakwa buru ebum n’uche iji nweta Chineke.
Ọkara omume ime mmụọ n’usoro buru ibu ga-apụta ihe dị ka elekere anọ ruo elekere ise nke omume otu mbọchị. N’ụdị ịdị mma, ihe ọpụtara bụ na onye ahụ na-eme ọtụtụ omume ya kwa ụbọchị dị ka ijere Chineke ozi.
Biko jee na edemede maka akara aka, omume ama ụma eme na iwu nke karma.
5.2 Mbara ala na kpakpando na-emetụta akparamagwa ụmụ mmadụ, otu ọ dị ha na-eme dịka akara ngosi.
Dịka sayensị nke ime mmụọ:
- Ndụ nke mmadụ ma ọ bụ ihe na-eme gasị n’ụwa abụghị naanị ihe ndị dị na mbara igwe na-emetụta ha ma ọ bụ ọnọdụ ha. Ọ bụrụ na anyị ga-ewere nnukwu ma ọ bụ mmetụta anụ ahụ, enwere ihe ndị ọzọ nke nwere ike imetụta ndụ anyị, ma ọ gaghịkwa ejedebe na naanị ihe ndị dị na mbara igwe.
- Otu ọ dị o kwenyere na ihe ndị dị n’eluigwe na-enwe mmetụta nwere oke na ndụ ụmụ mmadụ, N’ịmaatụ mmetụta nke ọnwa zuru ezu na nke ọnwa ọhụrụ na ndụ ụmụ mmadụ ka edepụtara nke ọma. Yana nke a, ihe ndị dị na mbara igwe na-eme dị ka ihe nrịbama ma ọ bụ ụzọ ụzọ ndụ ya.
Jee na nkebi 5.4 maka mmetụta niile bụ isi na ndụ mmadụ
5.3 Ịgụ kpakpando dịka sayensị
Ịgụ kpakpando dị ka sayensị ugbu a bụ akụkụ nke so na sayensị nke ime mmụọ. Ihe kpatara nke a bụ na ịgụ kpakpando nwere nkwenye na nkwado dabere na nyocha site na nlele, ntinye na mmechi dị ka sayensị nke ugbu a. Otu ọ dị iji imata ọdịnaihu na sayensị nke ịgụ kpakpando bụ naanị ma onye na-agụ kpakpando bụ nke nwere ọkwa ime mmụọ dị elu.
Ịgụ kpakpando nwere mgbọrọgwụ ya na Akwụkwọ nsọ Vedic ochie nke ndịIndia. Ndị ndu nke India oge ochie mara ọtụtụ eziokwu banyere mbara igwe na ụwa anyị ọtụtụ puku afọ gara aga nke sayensị ugbu a ka na-amata n’ ọ dị nso a. Ụfọdụ n’ime eziokwu ndị a bụ:
- Na Anyanwụ anyị dị obere ma e jiri ya tụnyere anyanwụ ndị ọzọ nke ndị Ndu ochie India mara puku afọ asaa gara aga.
- Nkọwa nke nebulae nke ndị sayensị ugbu a setara ka enwetara na Rigveda malitere na puku afọ ole na ole gara aga.
- Na kpakpando Vega (ana akpọ Abhijit n’asụsụ Sanskrit) ridatara ala na elu igwe puku afọ iri na abụọ C. nke ndị maara mbara igwe ugbu a maara, Sage Vyas ekwula ya n’afọ puku ise, narị ise na iri isii na otu (5561) B.C
(Ref: The book Vedicscience and Vedic time calculations by Dr. P.V. Vartak) - Na ịgụ kpakpando dị na Vedic, anyị na-ahụ nkwupụta na Ụwa bụ ihe na-eme njegharị mana ọ dị ka ọ kwụ otu ebe, dị ka ndị na-ahụ Vedic na-ekwu, ogologo oge tupu Galileo achọpụta ya. (Ref: The Storehouse of Wisdom Dr. R.N. Aralikatti)
- Ndị Ndu nke India chọpụtara n’ụzọ ịtụnanya ụzọ aghụghọ na omimi mmekọrịta uche na ahụ dị ukwuu na-emetụta n’etiti mmadụ na mbara igwe na usoro dị n’okpuru mbara ala. Olee otu ndị mmadụ n’oge ndị ahụ dị anya si mara nke ukwuu gbasara ọnọdụ na ihe na-edozi ụzọ nke usoro dị mkpa na agwa nke mmekọrịta dị n’etiti mmadu na ụwa, ọkachasị mmetụta nke ihe ndị dị n’eluigwe, Anyanwụ na Ọnwa na ụzụ ọkụ dị iche iche na-apụta site na mpụta ihu na ime nke ụwa, na-enweghị nwale ma ọ bụ ngwa nyocha ọ bụla? Ihe ndị niile ka e bu n’uche ma na nyocha ma na ọgwụgwọ! Ọ bụ na nke a a anaghị egosi oke ọdịbendị (omenala) dị ịtụnanya nke kwesịrị ịkpalị anyị inwe mmasị, ekele na ọchịchọ ịmụ ihe? (Ref: Professor Alexander Spirkin, a well-known psychologist, as quoted in Indastro.com)
Ịgụ kpakpando bụ ihe pụrụ iche dị ka sayensị na usoro ihe ọmụma dị ka ọ na-aghọta ụfọdụ ruo n’oke nke ụwa dị omimi nke ana-enweghị ike ịghọta site na uche ise, uche na amamihe(ọgụgụ isi). N’ịmaatụ, ịgụ kpakpando nwere ike ikwu ma onye ahụ na-enwe mmetụta site na nna nna ya ochie, dabere na ọnọdụ nke ihe ndị dị na mbara igwe.
N’akụkụ aka nke ọzọ, sayensị ugbu a na-agba mbọ ịghọta eluigwe na ala site na akara nke uche ise, uche na amamihe. Ọtụ ọ dị oke nke ụwa ana ahụ anya amaara atule ya na nke dị omimi ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ 1: ebighebi. Sayensị ugbu a site na ngwa ọrụ sayensị ugbu a enweghị ike ịchọpụta nsoghu ma ọ bụ ihe isi ike na ndụ nke nwere ihe na-akpata ya n’ụzọ ime mmụọ. N’ịmaatụ, ọ bụrụ na mmadụ na-enwe mmetụta site na nsogbu nna nna ochie, Sayensị ugbu a enweghị ike ịchọpụta ma ọ bụ gwụọ ihe mgbaama a. Ọ bụ ihe ịja mma na site na amamihe, ndị na-agụ kpakpando maara ihe ( ya bụ onye na-agụ kpakpando Vedic, nna mbụ nke ndị na-agụ anyị kpakpando) nwere ike ịghọta ọ dịkarịa ala akụkụ ụfọdụ nke ụzọ dị omimi iji wee chọpụta na nna nna ochie onye ahụ tọrọ atọ na mpaghara nether ụfọdụ ma chọọ enyemaka nke ụmụ ụmụ ha.
Ọzọkwa gbasara arụmụka niile ma ịgụ kpakpando abụ sayensị ma ọ bụ na ọ bụghị yana ebumnuche ma ọ bụ arụmụka mere megide ya isi ihe ndị a n’esonụ ka enwere ike iburu n’uche: Ọ dị ka ịgụ kpakpando nwetago ngwụcha mkpirisi mkpisi ma ekwuo ya na nke sayensị nke ugbu a dị ka ikpe. Sayensị ekwesighị ibu otu narị % iji were bụrụ sayensị. N’ịmaatụ, ọ bụrụ na onye ọka mmụta banyere ala (geologist) (agbanyeghị na eji ijeri kwuru ijeri ego kwado ya) enweghị ike ikwu ebe na mgbe ala ọmajijiji ọzọ ga- eme, anyị anaghị ekwu na ịgụ maka ala abụghị sayensị. Ọ bụrụ na onye dịbịa oyibo dọkịta emee nchọpụta na-ezighị ezị anyị anaghị elelị ọrụ ahụike niile. Ime otu ahụ dị ka itụfu nwatakịrị ya na mmiri ịsa ahụ. N’ihi izi ezi anyị kwesịrị iji otu usoro ikpe ahụ siri ike nke anyị nwere maka usoro ọmụma dị ka ịgụ kpakpando, maka sayensị nke oge a kwa.
5.4 Izi ezi nke ịgụ kpakpando
Dị ka ekwuru n’mbu, ịgụ kpakpando ka etinyere n’ụzọ anọ. Kedu ihe kacha egosi izi ezi enwere ike inweta na nkezi na ngwa anọ nke ịgụ kpakpando? Nyocha ọka mmụta ime mmụọ emere gosipụtara ihe ndị a na-esonụ:
Ngwa |
Ngwa pụtara |
Kacha kwe |
---|---|---|
Na-ebu amụma |
Ịmata banyere ihe ga-eme n’ọdịnihu |
% iri atọ |
Nchọpụta |
Iji mee ihe dị ka enyemaka iji ghọta ihe kpatara Nsogbu na-emetụta akụkụ ọ bụla nke ndụ |
%iri abụọ na asaa |
Ọdịdị dị mkpa na ndakọrịta |
Iji ghọta udịrị mmadụ na ndakọrịta onye abụọ ya na ndụ ma ọ bụ ọrụ dabere na ịgụ mgbama kpakpando ma ọ bụ ihe nyopụtara |
%iri abụọ na asaa |
Ime mkpebi |
Nke a gụnyere ịmara oge dị mma iji na-eme atụmatụ ihe omume achọrọ ma ọbụ zaa ajụjụ dị ka mgbe mmadụ kwesịrị ịlụ di ma ọ bụ nwunye |
% ise |
2Izi ezi a dabere na ikike iji chọpụta isi ihe kpatara nsogbu n’ofe ụzọ nke ahụ, uche na mmụọ.
- Ngalaba ise nke ise na ekwu maka ihe na-emetụta izi ezi nke ịgụ ihe nlere edepụtara maka ịgụ kpakpando. Ihe na-akpata nsogbu/ihe omume n’ndụ anyị dị ọtụtụ ma ịgụ kpakpando enweghị ike ịchọpụta ha niile. Ha gụnyere, akara aka yana ndekọ inye na iwere, ndị mmụọ (ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma, na ihe ndị ọzọ ga), Ike dị mma, etu anyị si eme nwere onwe anyị ( ịma ụma mee ihe), ike ime mmụọ n’ime ahụ na gburugburu ebe obibi gbara anyị okirikiri.
- Ọtụtụ n’ime anyị nwere ike na-achọ ịhapụ ịgụ kpakpando dịka sayensị site na ọnụ ọgụgụ dị n’elu.
- Nkejiri ya na nnarị n’eziokwu bụrụ nnukwu ibụ mgbe I tụnyere ya na usoro mmụta ndị ọzọ na ọzụzụ ha dị iche iche. Tinyere ọnụ ọgụgụ ndị edere n’okpuru, tụlee eziokwu na onye na-agụ kpakpando nwere ike inweta nkeji nnarị ndị a site na naanị mpempe akwụkwọ dịka o megidere sayensị ugbu a nke e ji ijeri dollar na-akwado ma jiri akụrụngwa ọrụ kachasị ọkaibe.
Nke a bụ ọmụmaatụ ole na ole ebe ọtụtụ ọzụzụ dị iche iche nọ n’okpuru sayensị ugbu a na-aga nke ọma na ọmụmụ ha dị iche iche.
- Ịgụ maka ala (Geology): Enwere mmasị dị ukwuu na ibu amụma ebe na oge oke ala ọma jijiji maka nnukwu ike ha nwere ibibi ihe. Ọ bụ ezie na amara ọtụtụ ihe banyere ebe ala ọma jijiji nwere ike ime, ugbu a enweghị ụzọ kwesiri ntukwasi obi iji buo amụma ụbọchị ma ọ bụ ọnwa mgbe ihe omume ga-eme n’otu ebe. (Ref: Department of Earth and Space Science – University of Washington)
- Ọgwụgwọ uche (Psychotherapy): Ndị ụlọ akwụkwọ nke obodo na-ahụ banyere iṅụfe mmanya oke na iṅụ oke mmanya gụrụ banyere ndị ọrịa dị out puku na nnarị asaa afọ ole na ole gara aga. Ndị ọrịa ekpokọtara ọnụ maka ọgwụgwọ na ịnata nlekọta, naanị ụzọ %iri anọ na anọ jisiri ike nọrọ na nwayọọ ruo ọnwa atọ ebe naanị %iri abụọ na isii na-abịa anara ọgwụ ala jisiri ike ruo ọnwa atọ na ịnọ nwayọọ. (Ref: Pulitzer.org)
- Ọgwụ (Medical): A chọpụtara na ọnụ ọgụ ịlanarị cancer ngụngụ dị ntakịrị karịa %iri. (Ref: cancerresearchuk.org)
Anyị aga-eleghara sayensị ndị a ma ọ bụ usoro mmụta ndị a anya naanị n’ihi na anyị nwere ntakịrị ihe ịga nke ọma na ọmụmụ ihe ndị a?
5.5 Ihe ndị na-emetụta izi ezi nke ịgụ kpakpando
5.5.1 Dabere na omenala nke ịgụ kpakpando ejiri mee ihe
E nwere ọtụtụ omenala ndị ejiri mee ihe na-ịgụ kpakpando. Nke ọ bụla n’ime ha nwere usoro dịgasị iche iche. Tebụl na-esonụ bụ eserese tụlere izi ezi enwere ike inweta site na omenala ndị dị mkpa enwetara site na nyocha ime mmụọ.
Rịba ama: Eziezi dabere na otu ikike nke onye na-agụ kpakpando nke nwere ike inweta %iri atọ ziri ezi na usoro ịgụ kpakpando Vedic.
5.5.2 Dabere na ọkwa ime mmụọ nke onye na-agụ kpakpando
Dabere na ọkwa ime mmụọ nke one na-agụ kpakpando ihe enweta nwere ike ịdị iche na iziezi.
Ọkwa ime mmụọ nke onye na-agụ kpakpando |
Iziezi |
---|---|
%iri abụọ3 (ya bụ onye nkịtị, anaghị eme omume ime mmụọ) |
% iri abụọ na asaa |
%iri atọ |
% iri atọ na otu |
% iri anọ4 |
% iri atọ na anọ |
% iri ise |
% iri atọ na asatọ |
% iri isii |
% iri anọ na abụọ |
Karịa % iri asaa5 | Ọdịghị mkpa ịgụ kpakpando |
Ihe odede n’ala (dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị dị na okpokoro dị n’elu):
3Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n’oge ugbu a adịghị eme omume ime mmụọ. N’ihi nke a, nkezi ọkwa ime mmụọ n’oge ugbu a oge ọgbaghara(Kaliyug) bụ %iri abụọ.
4Dịka isi iwu, n’oge ugbu a ihe dị ka mmadụ anọ n’ime mmadụ nnarị ọ bụla nọ n’etiti ọkwa ime mmụọ dị iri anọ% ruo iri anọ na itenanị%.
5N’afọ puku abụọ na iri na isii (2016) enwere ihe dị ka otu puku ndị Nsọ dị nọ n’agbata ọkwa ime mmụọ nke iri asaa% na otu nnarị%. Ọtu ọ dị enwere ndị Nsọ na ndị Ndu(Gruru) erughị nnarị abụọ na-agbasi mbọ ike igbasa ozi ime mmụọ.
5.5.3 Dabere na onye na-eme omume ime mmụọ
Naanị ụzọ eji emeri akara aka ma ọ bụ nwe nchekwaba site na ya bụ ime omume ime mmụọ. Nke a bụ n’ihi na akara aka nke bụ nsogbu ime mmụọ nwere ike inwe mmeri naanị site na ọgwụgwọ ime mmụọ. Ọtu ọ dị mmetụta nke omume ime mmụọ na ememe okpukpe emere iji merie nsogbu ebe ihe kpatara ya bụ ihe ime mmụọ n’ọdịdị ya egosighị na eserese ahụ. Ya mere ndepụta ịgụ kpakpando egosighị omume ime mmụọ nke onye ahụ na-eme.
N’ọmụmaatụ, mgbe amụrụ mmadụ ọ bụrụ na onye na-agụ kpakpando achọpụta nsogbu nna nna ochie na ihe nlere akara aka nke onye ahụ na ọ bụrụ na onye ahụ eme ememe na ihe ndị ọzọ ga, mgbe ahụ e wepụ ntụpọ ahụ mana onye na-agụ kpakpando ọzọ ga-agụkwa ya n’otu ụzọ ahụ. Site n’echiche a, ịgụ akara dị n’ime aka ka dị elu karịa ịgụ kpakpando dị ka mgbanwe ndị a na-egosi n’ahịrị dị n’aka. Dị ka onye nkịtị na anaghị eme omume ime mmụọ n’echiche nke ụwa, ọ naghị enwe n’ezie mmetụta site site na ezughị ezu nke ịgụ kpakpando.
5.5.4 Dabere n’ụdị ajuju nke a na-aju onye na-agụ kpakpando
Iziezi dabekwara n’ụdị ajuju nke a na-aju onye na-agụ kpakpando.
N’ọmụmaatụ, mmadụ nwere ike iju onye na-agụ kpakpando ma o nwere ike itinye ego na otu ihe ma ọ bụ nke ọzọ. Onye ọzọ nwere ike ịjụ ma ọ ga-alụ onye mbu ka ọ bụ onye abụọ.
Enwere ike inweta ihe kachasị mma ma ọ bụrụ na onye ahụ ajuọ ka ọ ga-etinye ego ma ọ bụ na ọgaghị na mbu ma ọ bụ ma ọ ga alụ dị ka ọ gaghị.
Ọ bụrụ na ajụjụ mmadụ nwere dị na usoro ndị a na n’esonụ, enwe ike inweta azịza ndị ziri ezi.
Ajụjụ 1: Mmadụ ekwesịrị itunye ego na ihe ncha?
Ajụjụ 2: Ọ bụrụ na ọ bụ mgbe ahụ na gịnị?
Ajụjụ 3: Olee oge m ga-etinye ego?
— ma ọ bụ —
Ajụjụ 1: Ekwesịrị m ịlụ dị na mbu?
Ajụjụ 2: Ọ bụrụ na ọ bụ mgbe ahụ onye?
Ajụjụ 3: Olee mgbe ọ aka mma?
5.5.5 Dika oge eji mụọ mmadụ
Ọ bụrụ na ihe nlere inyocha akara aka emere dabere na oge eji tụrụ ime, mgbe ahụ enwere mbawanye n’ọkwa nke iziezi.
Ihe kpatara mbawanye na iziezi ka anyị na-agaghachi azụ n’oge mgbe adị ime bụ ndị a:
- Ụkpụrụ bụ na ka mmetụta akụkụ ụwa na-abawanye ka iziezi na-ebelata.
- N’oge nke itu ime mmetụta nke nne ahụ na ugburugburu ebe obibi ya n’ebe nwa nọ n’afọ dị ntakịrị. Ka oge na-aga, nke a na-abawanye, ya mere iziezi ana ebelata.
Otu ọ dị, olee onye ga-abụ nne nwere ike ikwu kpọkwem oge nke o jiri ịtụrụ ime? N’ime arụ anyị enwere nde kwuru nde ihe na-agbakọta ọnụ họrọ anụ arụ. Na otu n’ime ihe ndị ahụ mgbanwe na-eme siri ike ịghọta. Olee nwanyị nwere ike ịghọta nke a? Naanị onye nke rugoro ọkwa ime mmụọ nke onye Nsọ nke iri itenanị% na karịa, ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịma. Otu ọ dị onweghị onye na-atụ ime n’ọkwa ime mmụọ dị elu otu a. N’oge ochie, ndị nwunye nke ndị Ndu na abụ karị ndị toro eto n’ime mmụọ, na-ama bu ezi oge nke mmalite nke afọ ime ha.
Iziezi nke otu narị% nwere ike ibụ naanị onye Nsọ nke ọkwa ime mmụọ nke iri itenanị% na karịa nwere ike inweta ya, nke a bụkwa ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịma, Ọtụtụ oge ha agaghị etinye ikike ime mmụọ ha na ịchọpụta nke a, karịa ma mkpụrụ arụ ahụ aga amụ bụ nke karịrị ọkwa ime mmụọ iri asatọ% na na eziokwu gbasara ọmụmụ nwa ahụ ka ekwesiri ime tupu amụọ ya dị ka Chineke si chọọ. Dị ka ihe kpatara ụdị ọmụmụ nke a dabere na uru ime mmụọ nke ụmụ mmadụ, enwere nnukwuu ogologo Eziokwu zuru ụwa ọnụ, ọsịsa ndị enwetara ga-adịkwa oke iziezi. Ọ bụrụ na ọ bụ ọmụmụ nkịtị mgbe ahụ akụkụ ụwa (asat – atapịrị ka nke ‘na-abụghị eziokwu’) bụ karịrị, ya bụ iziezi na-ebelata.
6. Na nchịkọta
- Iziezi nke ihe nlere inyocha akara dabere ozugbo n’ike nke nkọwa nke onye na-agụ kpakpando.
- Ọ bụrụ na anyị na-atụle ike nke ịkọwa ihe nke onye na-agụ kpakpando ugbu a (onye nwere ike ibu amụma kacha ihe ruru iri atọ% na iziezi) dịka otu, mgbe ahụ iji nweta otu nnarị% ọsịsa ziri ezi ike nke ịkọwa ihe ga-adị mkpa ịdị ugboro otu puku ike nke ịkọwa ihe ugbu a.
- Ike nke ịkọwa ihe na mmetụta ihe ọdịnaihu nwere ike ibawanye naanị site na omume ime mmụọ.
- N’ime oge a iri isii na ise% nke ndụ anyị bụ akara aka. Ọ bụrụ na anyị ewere iri atọ na ise% nke ime uche aka anyị wee na-eme omume ime mmụọ, anyị nwere ike imeri ma ọ bụ nwee nchekwaba site na akara aka anyị. Omume ime mmụọ bụ naanị ụzọ iji gbochie akara aka dị njọ.