SSRF na-enye ndụmọdụ na- aga na-aga n’ihu n’usoro iji ọgwụ dị iche iche na-agwọ ọrịa tinyere usoro ọgwụgwọ ọrịa nke ime mmụọ maka ọgwugwọ nke anụ ahụ na nke uche.
A na-adụ ndị na-agụ akwụkwọ a ọdụ ka ha wee were ọgwụgwọ ọrịa ọ bụla nke ime mmụọ na nghọta nke onwe ha.
Contents
1. Gịnị bụ ngwọta mmiri nnu?
Mmụọ ( ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma na ndị ọzọ) na-emetụta ndị mmadụ ma mee ka ha nwee nsogbu site na ike ojii ha dị omimi. Ike ojii nwere ike ịmepụta ọtụtụ nsogbu dịka ida mba n’obi, iche echiche edoghị anya ma ọ bụ adịghị mma nke ahụ nke na – eduga na nsogbu ndị ọzọ dị ka mmetọ, nsogbu ego ma ọ bụ ihe mgbu obi.
Ọgwụgwọ mmiri nnu bụ ngwọta ime mmụọ dị mfe ma dị ike iji gbochie nsogbu ike ọjii ahụ adịghị ahụ anya ma kpochapụ ya na usoro ahụ anyị. Site n’ime otu ahụ, anyị adịghị emebi omume ime mmụọ anyị na- egbochi ike ojii. Kama enwere ike iji ya mee ka anyị na-eto n’ime mmụọ.
2. Ole mgbe ka anyị kwesịrị iji na-eme ọgwụgwọ mmiri nnu?
Onye ọ bụla n’ime anyị na-enwe mmetụta nke ndị mmụọ na ogo dị iche iche. N’ihi ya, anyị nile nwere ogo ụfọdụ nke ike ojii n’ime ahụ anyị. Ime ọgwụgwọ mmiri nnu kwa ụbọchị na-enye aka wepu ike ojii a na ahụ anyị.
Ọgwụgwọ mmiri nnu kwesịrị karịsịa ka a na-eme ya mgbe a na-enwe ihe mgbaama ndị dịka:
- Ajụ/Ike ọgwụgwụ
- Mbenata na-ime ngwa ngwa
- Enweghị ike iche echiche
- Oke echiche ọ kachasị mgbe ha bụ ọdịdị na-adịghị mma
- Iwe ma ọ bụ mmetụta uche ndị ọzọ dị ukwuu
- Nchegbu/Ndọgbu
- Ụdị ọrịa ahụ ọ bụla
Mgbe anyị na-enwe ihe ọ bụla n’ime ihe mgbaama ndị a dị n’elu, anyị nọ n’ọnọdụ ịda mba nke anụ ahụ, mmetụta uche ma ọ bụ nke ime mmụọ. Ndị mmụọ na-awakpo anyị n’ọnọdụ a ma tinyekwuo ike oji ma na-ebulikwa mgbaama ndị ahụ elu karị.
Foto dị n’okpuru ebe a bụ ihe osise dabere n’nghọta dị omimi nke mmụọ nke na-akpata ịda mba n’obi n’ime mmadụ.
Pịa ebe a iji gụọ ihe ọmụmụ nile
Mata: Oge ọ bụla anyị nọ ọnọdụ adịghị ike ( ọkachasị na ọkwa ime mmụọ) anyị na ahapụ onwe anyị oghere maka nwakpo, dị ka ọ dị na nke a na mmụọ(ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma, na ndị ọzọ ga) chọrọ ike kachasị nta iji mmetụta anyị
N’ọnọdụ ọtụtụ nsogbu, enwere ike na-eme ọgwụgwọ mmiri nnu ugboro abụọ ruo ugboro atọ n’otu ụbọchi na elekere abụọ – atọ gasịa maka nweta kacha mma
3. Kedu ihe achọrọ maka ọgwụgwọ mmiri nnu a?
- Nnukwu ịwụ
- Mmiri jụpụtara na ịwụ ( ruo ọkara) iji kpuchie nkwonkwo ụkwụ mgbe a wunwere ụkwụ n’ime ịwụ ahụ
- Nnu nkume
- Ọ bụrụ na nnu nkume adịghị, e nwere ike iji nnu mmiri/okpokoro nnu, otu ọ dị, ịdị ire nke ọgwụgwọ ga-ebenata ruo iri atọ% (nke ọgwụgwọ mgbe eji nnu nkume)
- Akwa nhịcha
- Ute ụkwụ
4. Kedu ka esi eme ọgwụgwọ mmiri nnu?
4.1 Ntụziaka nzọụkwụ, nzọụkwụ
Nkwadebe:
-
Gbanye mmiri na ịwụ (ruo ọkara) ka okpuchie nkwonkwo ụkwụ. Tinye nnu nkume ụjụ ngazi nri abụọ.
-
Kpegara Chineke ekpere n’eziokwu na n’okwukwe iji wepu ike ojii dị n’ime gị. Nakwa kpe ekpere ọkachasị maka imebi ike ojii nke mmụọ (ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adịghị mma, na ndị ọzọ ga) na emetụta gị. Ekpere bụ ihe dị mkpa nke na-eme ka ọgwụgwọ a dị ire.
Ọgwụgwọ:
-
Nọdụ ala ọkpakpa wụnye ụkwụ na mmiri nnu. Debe ụkwụ ngbasa ihe dị ka ohere abụọ – atọ n’etiti ụkwụ. Nke a na-enye aka nke ukwuu na-ịgbasịsị ike ojii. Ọ bụrụ na ụkwụ na-emetụ onwe ha, mgbe ahụ enwe ngbochi na mgbasịsị nke ike ojii site n’ụkwụ.
-
Debe ụkwụ n’ime mmiri nnu naanị elekere iri – iri na ise.
-
Aga-fekwana elekere iri na ise maka na ike ojii nke adọkpụnyegoro n’ime mmiri nwere ike ịlaghachị azụ n’ime ahụ.
- Mgbe ị wụnyere ụkwụ, kpọba Aha nke Chineke dịka nkwenye gị.
Na mmezu:
-
N’oge mmezu nke ọgwụgwọ a nye Chineke ekele ma kpee ekpere maka ikepụta ihe nkpuchi nchekwaba gba gị gburugburu.
-
Mgbe ahụ ghafuo mmiri nnu ahụ n’ime ebe nkpochi ma sachapụ ịwụ na mmiri dị ọcha.
4.2. Ihe nkiri nyonyo na-egosi ka esi eme ọgwụgwọ mmiri nnu
5. Gịnị bụ usoro nke eji ewepu ike adịghị mma?
- Nkpọkụ na ekpere na-eme ka npekele ike ojii nke mmụọ gbanyere n’akụkụ ọdịdị anyị dị iche iche gbakapụta ma gbarịe.
- Mmiri nnu (mmiri nwere nnu nkume) n’onwe ya nwere nwenwe nke nwere ike ịmịpụta ike ojji ahụ..
- Ka ike ojii ahụ na-apụga, o nwere ike mgbaama ana-eso ya dịka ughere, nkọọ/ubiri, ọtata ngwere ụkwụ, ekpomọkụ na ntị na anya, n’ihe ndị ọzọ ga. Oge ụfọdụ ana-enwe mmetụta nke ịnọanọ (ịmị amị) na ụkwụ a wụnyere. Nke a bụ akara nke n’ike ojii na-apụta. Achọpụtakwara na ụfọdụ oge emecha ọgwụgwọ mmiri nnu, mmiri na-adị ojii ma ọ bụ o enweta isi ọjọọ ma ọ bụ oge ụfọdụ mmiri adị ọkụ karịa. Nke a bụ n’ihi mmekọrịta nke ikikere ojii na-apụsịta site n’ahụ.
- Ọ na-arụ ọrụ n’ọkwa nke Ụkpụrụ Mmiri zuru oke ( iri asaa%) na Ụkpụrụ Ala zuru oke (iri atọ%).
5.1 Enwere ike iji nnu Epsom karịa ma nnu nkume ?
Nnu Epsom bụ magnesium sulphate ọ dị iche na nnu nkume nke bụ sodium chloride. Ebe amara nnu Epsom na onwere ọtụtụ uru ahụ na ahụ ike, site na-ileba anya nke iwepu ike ojii site na ahụ, nnu Epsom adịghị mkpa.
6. imatụ nke uru nke ọgwụgwọ a
6.1 Gini na-eme n’ezie n’ụzọ di omimi mgbe ana-eme ọgwụgwọ mmiri nnu?
Mgbe onye na-enwe mmetụta nke mmụọ (ekwensu, mmụọ ọjọọ, ike adighi mma, na ndi ọzọ ga) mere ọgwụgwọ mmiri nnu, Madhura Bhosale, onye na-achọnụ nwere ikike uche isii nwetara mmetụtụ ndi a na-esonu nke ọgwụgwọ a na ebe mmụọ na ike ojii ya nọ.
6.2 Ihe osise dabere na nghọta dị omimi nke ike ojii ana-ewepụ
Ihe dị n’elu bụ ihe osise dabere na nghọta dị omimi nke mmetụta nke ọgwụgwọ mmiri nnu maka ike ojii nke amosu (chetkin) nke na-akpata oke echiche mmekọ nwoke na nwanyị n’ime mmadụ.
Jee na ọmụmụ nke oke echiche mmekọ nwoke na nwanyị
Ọzọkwa, jee na Gịnị mere anyị ji enwe nchekwaba gburugburu?