Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche

Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche

1. Okwu mmalite banyere etu agwa dị iche iche si na-enwe mmetụta ime mmụọ nye anyị

Anyị nile na-eme nhọrọ kwa ụbọchị banyere agwa. Ịmatụ bụ ihọrọ agwa nke uwe nke anyị ga-eyi maka ụbọchị ahụ. Site n’oge ruo n’oge, anyị kwesịrị ịhọrọ agwa nke ụdị akwa akwa ọzọ nke anyị na-azụta. Oge ụfọdụ anyị ga-ahọrọ agwa nke agwa maka mgbidi dị n’ụlọ anyị.

Site na nyocha ime mmụọ, anyị achọpụtara na dabere na ụdị agwa anyị họrọ (ya bụrụ akwa ma ọ bụ gburugburu ebe obibi anyị), anyị ga- enwe mmetụta n’ọkwa ime mmụọ dịka otu osi dị. Na edemede a, anyị ga-eke ụfọdụ nyocha ime mmụọ nke anyị maka ụzọ dị iche iche agwa si enwe mmetụta nye anyị ka ndị na-agụ akwụkwọ anyị dị njikere iji mee mkpebi ndị ga-eme ndụ ha ka mma.

2. Olee otu agwa dị iche iche si emmetụta anyị n’ụzọ ime mmụọ?

Eluigwe na Ala niile, n’ụzọ adịghị nhụta dị aghụghọ, ka ejiri ụzọ ihe atọ dị omimi nke Sattva, Raja and Tama. Were mee. Anyị kọwara nke a n’ụjụ na weebụsaịtị anyị ma na-agba gị ume kai we ịmata na onwe gị ụdị eciche a, iji nweta nghọta ka mma banyere isiokwu a.

A na- edekwa agwa dị ka sāttvikrājasik or tāmasik dabere na akụkụ dị omimi ha nke kachasị. Sattva pụtara ‘ịdị ọcha n’ime mmụọ’ ebe Raja na Tama pụtara ‘omume’ na ‘amaghị ihe nke ime mmụọ’ n’otu n’otu. Mgbe anyị na-eyi akwa nke agwa sattvik, ọ na-enwere anyị aka n’omume ime mmụọ anyị, Ebe agwa ndị bụ Raja-Tama n’ọdịdị ha na-adị njọ iji mee ọganihụ ime mmụọ. Iyi akwa ndị nwekarịrị Raja-Tama na-amụba mmegharị ime mmụọ na-adịghị mma na ugburu gburu anyị. N’ihi ya anyị nwekwara ike ịdọta ike adịghị mma dị ka ha kakwa na Raja-Tama.

Ihe ndị a bụ ndepụta nke agwa na mmetụta ha n’ọnọdụ ime mmụọ anyị. Mgbe a kọwara agwa ka ihe na-‘enye aka’ dị ka esi kwuo na eserese dị n’okpuru ebe a, ihe ọ pụtara bụ na agwa na-enye aka iji na-adọta ụda nke ime mmụọ dị mma ma na-eweghachi ụda na-adịghị mma. ‘mmetụta ọjọ’ na-egosi ikikere na-adọta ịkpa ụda na-dịghị mma ma n’otu oge na-ekewapụ anyị na ịkpa ụda dị mma nke ime mmụọ.

Otu agwa si emetụta anyị n’ụzọ ime mmụọ

Agwa Ihe dị omimi kachasi Mmetụta na ebe anyị nọ
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Ọcha Karịrị Sattva Enyemaka kachasị
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Odo Sattva Enyemaka nke ukwuu
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Anụnụ igwe Sattva Enyemaka nke ukwuu
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Anụnụ anụnụ Sattva Enyemaka nke ukwuu
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Edo Sattva Enyemaka
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Oroma Sattva-Raja Enyemaka
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Akwụkwọ ndụ Sattva-Raja Enyemaka
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Uhie uhie Raja Ọkara enyemaka/mmetụta ọjọ 1
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Akwụkwọ ndụ dị nji Raja-Tama Ọkara enyemaka
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Odo odo Raja-Tama Ọkara enyemaka
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Violet Raja-Tama Ọkara enyemaka
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Aja aja Tama Ọkara enyemaka
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Awọ-awọ Tama Ọkara enyemaka
Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche Oji Tama Kachasi dị njọ

Ihe odide dị na ala:

1 Ihe ọ bụla bụ isi ụdị mmadụ, ya bụ sattvik ma ọ bụ tamasik agwa nke uhie uhie na-akpalitekwu ya.

Isi mbido: Nnyocha ime mmụọ nke ndị otu ọkacha mara nke mmụta ime mmụọ mere

Di ka ị nwere ike ịhụ site na eserese a dị n’elu, agwa dị ka ọcha, odo na anụnụ anụnụ na-enye aka na mmụba nke ọcha ime mmụọ ugburugburu anyị. Agwa oji na aka nke ọzọ, nwere ụda na-emerụ ahụ nke na-abụghị nani ịdọta ike adịghị mma kama na-ewepụkwa ike ọ bụla nke ime mmụọ dị mma.

Ihe osise abụọ a dabere na nghọta ọmụma dị omimi dị n’okpuru na-egosi ihe dị iche  na ụda ime mmụọ na etiti agwa ọcha na nke oji, oge eyi ha. Ọ kachasị, ihe osise dabere na ọmụma dị omimi nke na-elekwasị anya na ike nke na agwa na-adọta ma na-agbapụ, na nmmetụta ha na onye nke yi ha. Ihe osise ndị a dabere na ọmụma dị omimi bụ Ms. Priyanka Lotlikar, onye na-achọnu nwere uche isii toro eto nke ọhụụ sere ya. Ihe osise ndị a dabere na ọmụma dị omimi ka His Holiness Dr. Athavale. gosipụtara eziokwu ya ma kwado ya. Site na nyocha ime mmụọ, Ihe osise abụọ ndị a na-egosipụta ụda ime mmụọ nke oji na nke ọcha a chọpụtara na ha ruru ogo iri asatọ% na ịbụ eziokwu.

Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche

Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche iche

Ihe osise abụọ ndị a dabere na nghọta dị omimi na-egosi, na iche, ụda dị omimi nke agwa ojii na ọcha na-adọta ma na-ewepụ. Ụda nke ikpeazụ na-apụta ma ọ bụ onye ahụ na-adọta bụ nchịkọta ọnụ nke ọtụtụ ihe dị ka  ọkwa ime mmụọ, ntụpọ ụdị mmadụ, ọnọdụ uche n’oge ahụ, ma ike adịghị mma ana emetụta ya, ụdị na agwa uwe, na ndị ọzọ ga.

3. Ihe mere anyị ji achọ ụfọdụ agwa

Na ọkwa nkịtị: Mmadụ n’ozuzu nwere mmasị n’ụdị agwa n’ihi na ọ na-adabara ụda akpụkpọ anụ ahụ ya.

Na ọkwa uche: Mmadụ inwe mmasị ma ọ bụ enweghị mmasị nke ụdị agwa nwere ike igbanwe dị ka ọnọdụ uche ya si dị. Mgbanwe ọnọdụ ime mmụọ a na-abụkarị ka ọnọdụ dị, N’ịmatụ:

  • Dị ka ihe omume: Ndị mmadụ na-chọkarị iyiri agwa na-amụke amụke mgbe ha na-apụ apụ.
  • Dị ka ihe omume na omenala: N’oge olili ozu na ụfọdụ omenala, ana eyi uwe ojii, ma na ebe ndị ọzọ, ndị mmadụ na-eyi uwe ọcha. Jee na edemede nke Kedu ụdị agwa mmadụ kwesiri iyi maka olili ozu?
  • Dị ka omenala: Ndị ọka iwu na mba ụfọdụ na-eyi uwe oji n’ihi na ọ bụ omenala ime otu ahụ
  • Dị ka afọ: Ndị nọ n’afọ iri na ụma ha na na-ebido ịghọ okenye nwere ike inwe mmasị maka pink . Na ịka nka, mmasị na agwa a nwere ike ịda.
  • Dị ka agwa na-anọchite anya ihe:
    • Ụdị uwe na ejiji nke onye ama ama ọtụtụ mgbe nwere ike imetụta nhọrọ nke uwe onye na-akwado ya.
    • Ọ na ewụ ewụ
    • Ndị mmadụ nwere ike enweghị mmasị agwa maka na o nwere mekọrịta na otu akụkụ nke ọha mmadụ nke adịghị amasị ha.

Na ọkwa ime mmụọ:

  • N’ihi ọdịdị okike: Ihe kacha mkpa maka ihe mere mmadụ ji enwe mmasị na agwa ụfọdụ bụ n’ihi na ọ na-ejikọta isi ọdịdị ya na ya. Onye dị sattvik ga-n’achọ agwa dị sattvik dị ka ọcha ma ọ bụ chatụ anụnụ anụnụ. Ọ bụrụ ọdịdị okike onye ahụ bụ tamasik, ha ga-achọkarị agwa tamasik di ka ojii.
  • N’ihi mmetụta nke ike adịghị mma: Onye ike adịghị mma na-achị mgbe ọ bụla na-enwe ezi ụda ọbụna site na agwa ojii. Ụzọ anọ nile nke ahụ: nke anụ ahụ, nke uche, nke amamihe na nke onwe dị aghụghọ nwere ike inwe nsogbu ime mmụọ mgbe ike ọjọọ nwere onye ahụ. Ọ bụrụ na nsogbu ahụ na-adịgịde ogologo oge, onye ahụ na- ji nwayọọ amalite ịhapụ njirimara onwe ya. Agwa nke onye nwe ya na abịa n’ihu na-arụ ọrụ na-egosipụta ihe ndị na-amasị ya na ndị anaghị amasị ya nke na-egosipụta na omume onye ahụ. Nke a pụtara na nghọta onye ahụ na- enweta nchakwa zuru ezu site na ike adịghị mma nke nwe ya. Ebe ike adịghị mma ahụ ka bụrụTama, onye ahụ nakwa enwe mmasị na ihe ka bụrụ Tama dị ka uwe ojii.
Isi ihe nchọpụta site na nyocha ime mmụọ: Ihe na-eme eji na-eyi uwe ojii ka ejiji ndị isi ma ọ bụ na-eyi ojii kwa ụbọchị  na ndụ anyị bụ ike na- ezịghị ezi kpalitere ya ma nọgide na-akpaghasị uche ndị mmadụ site na mmetụta si na ime ha na dị aghụghọ.

 

Jee na edemede  – Kedu ọnụ ọgụgụ mmadụ ole bi n’ụwa enwere mmụọ ọjọọ?

Iyinye agwa ojii na-emetụtakwa ndị mmadụ nọ ya nso nso. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-enwe mmetụta nke ike adịghị mma ma ha yii uwe ojii, nke a na-enye aka na mgbanwe nke ike ojii dị omimi n’etiti ike adịghị mma abụọ. Ọtu ọ dị ọ bụrụ na o nwere otu onye na-agbasi mbọ ike itinye mgbalị na omume ime mmụọ ya n’ogbe ahụ, onye ahụ kwa ga-enwe mmetụta dị njọ site na mmụba nke akụkụ  tama n’ihi na onye ọzọ yii uwe ojii. Nke a bụ maka na ike adịghị mma na-atunye mgbalị ha na-anwa ime ka ndị mmadụ ghara ime omume  ime mmụọ siri ike ma dị ike.

  • N’ihi ihe dị n’echiche ndụ gara aga: Ọ bụrụ na onye yii uwe na-acha akwụkwọ ndụ merụrụ otu onye ahụ na ndụ gara aga, o doro anya na onye ahụ ga-enwe mgbagha na agwa n’acha akwụkwọ ndụ na ọmụmụ ya ọzọ na-abaịanụ site na mmekọrịta dị omimi.
  • Mgbanwe n’ihi ọkwa omume ime mmụọ: Onye na-achọnụ nke na-enwe ahụmahụ ọnọdụ nke mmetụta ime mmụọ na-anọgide nwere ike ịhọrọ agwa na-acha anụnụ anụnụ. Nke a bụ maka na n’ụzọ nke ime mmụọ, agwa dị omimi nke mmetụta ime mmụọ bụ anụnụ anụnụ.

4. Echiche ime mmụọ n’ozuzu ya mgbe ị na-ahọrọ agwa maka uwe

Agwa nke uwe kwesiri ịbụ sattvik: Họrọ agwa dị sattvik dị ka ọcha, edo, anụnụ anụnụ na onyinyo agwa ndị a. Nke a bụ otu n’ime ụzọ puku mmetụta nke agwa ndị a na ebe onye mmadụ nọ. Nke a dị ka ọ dị obere ga-ana enwe n’ọtụtụ ọnọdụ nnukwu mmetụta nke ahụ na uche. Na-agbanyeghị nke obere a, iyinye uwe nke akụkụSattva-Raja ya karịrị na-abụ uru onye ahụ site na:

  • Na-agbakwunye Sattva-Raja agwa ma ọ bụ
  • Mbelata nke akụkụ RajaTama karịrịn’ime ya.

Ọ bụrụ na mmadụ nwere mmasị na-iyi uwe ojii, o nwere ike ịchọ maka ihe kpatara ya ma ọ bụ ihe ngọpụ iji nọgide na-eyi uwe oji ọbụna mgbe ọ gụsịrị  edemede a. A na-akwadosi ya ike na ijiri ọgụgụ isi na-eme ihe nke a ga-abụ ihe mmebi. Nke a bụ maka na anaghị enwe mgbago na ime mmụọ ma eyiri uwe ojii, ọ pụtara imebi ọdịmma nke onye ahụ.

Ụcha nke uwe ekwesịghị ịbụ ịgba: ụcha nchake nwere ọtụtụ ihe dị omimi nke akụkụ Tama. Onye na-eyi uwe nke ụcha ya dị nchake na abụkarị tama ka oge na-aga.

Ụwe kwesịrị ịbụ otu na ụcha: Ụwe ụcha ya bụ otu, otu ụcha ime mmụọ na-enweghị ihe ọ bụla e dere ma ọ bụ esere na-egosi ezi uche, ya mere, a na-ewekarị ya karịa ka  sāttvik site n’echiche ime mmụọ.

Ụcha nke uwe kwesịrị ịdị na-akwado ibe ya: Ọ bụrụ na a ga-eyi akwa nke nwere ụcha dị iche na nke elu na nke ala, mgbe ahụ ụcha ha kwesịrị ịdị na-akwado ibe ya, ya bụ, ha kwesịrị ịdị na-arụkọ ọrụ, nke ọ bụla n’ime ha obekata mpe ọ bụrụ ihe ruru %iri abụọ. N’ịmatụ, nchịkọta ọnụ nke ụcha abụọ nke sāttvik ka bụrụ ihe ziri ezi n’ime mmụọ. N’okpụrụ ebe a bụ ụfọdụ ịmatụ nke nchịkọta ụcha sāttvik.

  • Ọcha na anụnụ adịchaghị anụnụ
  • Anụnụ adịchaghị anụnụ na anụnụ gbara ọchịchịị

E kwesịghị inwe ọdịiche dị iche na ụcha abụọ nke uwe: Ọ bụrụ na etikọ onyinyo abụọ dị iche iche nke ụcha ọnụ, ha na-emepụta ụda adịghị mma. Ye mere ekwesịghị inwe ọtụtụ ihe dị iche n’etiti ụcha abụọ ahụ. N’ịmatụ, zere nchịkọta nke edo edo(ụcha sattvik) na nke na acha akwụkwọ ndụ (ụcha rajasik). Ọtu ọ dị, ndo nke akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ nke na-ejikọta ọfụma ya na edo ga-eme ọfụma. Nke a bụ n’ihi na onwere edo n’ime ya, ya mere ọ dịkwuo sattvik.

Mmetụta ime mmụọ nke iyi ụdị agwa dị iche icheN’ọtụtụ ọrụ amara ama a na-ahụ ndị na-eyi ngwakọ uwe ojii na ọcha dika tuxedo. Ụwa na-ahụ ụdị iyinye ụwe a ka nkpokọta ọnụ nke nkwụchapụta na amara mmekọrịta. Otu ọ dị n’ọkwa ime mmụọ akụkọ a dị iche. Ụda dị omimi sitere na ịdị ọcha (sattvik) nke ụcha uwe dịka ọcha na ịdị (tamasik) omume njọ nke uwe dike ojii ka ọdị na-alụso onwe ha ọgụ. Ọgụ a na-eweta imepụta ụda nsogbu nke na-abawanye ikike nke mmetụta nke ike adịghị mma. N’ụzọ nke ime mmụọ ya mere ọ dị ka agaghị na-akwado iyinye uwe dị ka tuxedo, nke nwere ngwakọ oji na ọcha.

 

Ogo ụcha nke sattvik and rajasik di na akwa: Ọ bụrụ na ogo ụcha nke sattvik and rajasik dị na akwa bụ ụdị nke ogo nke ụcha rajasik  eji mee ya dị obere, mgbe ahụ ụda nke ime mmụọ sitere na akwa ahụ na aka mma. Ọ bụrụ akwa ọcha nwere ihe osise na-acha uhie uhie, mgbe ahụ ụda ọma ka ana enwe site na akwa ahụ. Ọ pụtara na mgbe ọnụ ọgụgụ nke ụcha sattvik dị na akwa ka bụo ibụ karịa nke ụcha rajasik, ọdịdị ire nke ụcha rajasik na-ebelata. Na nkenke, ụda sitere n’ụcha dị na akwa dabere na ụdị ọnụ ọgụgụ ụcha nke sattvik na rajasik ejiri mee ya.

Ọ bụ n’ihi omume ime mmụọ mmadụ na mgbe o nwetara ọkwa ime mmụọ nke karịrị iri isii%, mmetụta nke ụcha na uche ya na amamihe ya dị ntakịrị. Mmetụta a na-ebelata dị ka ọkwa ime mmụọ onye ahụ na-abawanye. Otu ọ dị o nwere ike na-emetụta ya n’ahụ nkịtị ebe ahụ dị nnukwuu (ịhụanya) na ọkwa ike adịghị mma dị elu nwere ike na-emetụta  ngwa ngwa ihe nke dị na mpaghara nke ana-ahụ anya.

5. Na nchịkọta

Anyị nwere olileanya na isi okwu a enyela gi nghọta n’ọkwa omume maka mmetụta ime mmụọ nke ụcha na ndụ gi. Isi iwu kachasị mkpa I ga-eburu n’uche bụ ịmụba akụkụ Sattva na ndụ gi ma beleta akụkụ Raja-Tama  na ndụ gị. Site na nghọta na iji ụkpụrụ ime mmụọ a na-eme omume na na-adịghị mbụgharị site na ihe tamasik ọ bụla na-agbanyeghị etu ọ bụla e esi mara ya, ga nanị agbakwụnye ọkwa dị elu nke ịdịmma na ndụ gi.