Gbasara Aṅuri

1. Gbasara Aṅuri

1.1 K’anyi malite n’isi isi mbido

Ọ n’enye aka mgbe ọbụla ị chọrọ ichọpụta ihe, ka i bido na imata ihe i bụ n’uche ị chọrọ ime na ndụ gi.

Onye ọbụla n’ime anyi tata n’ebi ndụ ngwa ngwa. Onweghi onye na-anaghachi azu le anya na ndụ ya, chee echiche hazie ihe ọ̣ chọrọ ime.

Ya bụ gini bụ ebum n’uche gi  ị chọrọ n’ndu gị?

I nwego ihe i ga eme mgbe nadighi anya  na  nke i ga eme mgbe di anya wee nweta ebum n’uche gi a ị chọrọ?

O nwego nke ọbụna i megoro?

Ka ọbụna ebum n’uche gi a ị chọrọ ime enwego mgbanwe na ime ahọ olemole garaga?

I nwere ike iji edemede a wee leba anya n’ime ndụ gi wee jụọ onwe gi ajụjụ ebe ọ na eje.

K’anyi gba mbọ kọwa ihe izizi kpatara e ji kee onye ọbụla di ndụ. I legharia anya,i ga achọpụta na anyi nile di iche iche, anyi sina ọtụtụ ezi n’ụlọ, anyi nwekwara omume di iche iche mana e nwere otu ihe onye ọbụla n’ime anyi ji di ka ibe ya.

Otu ihe jikọrọ mmadu nile ọnụ  n’agbanyeghi  okwukwe ha mọbụ ihe onye bụ: nwoke ka ọbụ nwanyi, ogbenye ka ọbụ ọgaranya,  bụ agụụ i nwe aṅuri. Agụụ a abụghị sọsọ nani maka ndi mmadu kama ọ bụkwazi  maka ihe nile e kere eke di ndụ, bido na obele nda ruo na nnukwu  enyi n’achọ aṅuri. N’imatụ, k’anyi were nda. Ọ ga- alipụta sina ebe ọ n’enwe mgbakasi ahụ gbaga n’ebe ọ ga enwe aṅuri. Ọbụrụ na ọ bia nso na ọkụ ọ ga efepu, mana ọ ga- aga ngwangwa gakwuru ebe a wụsara obele ọtọbụrịbụrị.

Ọ bụrụ na anyi chee echiche maka ya, ọ bụ na anyi nile anaghị agba mbọ ka anyi nọgide na ọnọdụ na atọ anyi ụtọ? ọ bụrụ na anyi anaghi agbasi mbọ ike ka anyi nwe aṅuri, opekata mpe anyi na agba mbọ ka anyi wepu ọnọdụ nadịghị anyi ụtọ. N’imatụ, anyi na-eme ngwangwa dosie ihe onyonyo ma ọbụrụ na ọ naghị alụ ọlụ nke ọma maka na anyi achọghị ka anyi ghara i nweta aṅuri site na ilele onyonyo nadị anyi mma