Okwu mmalite nke iwepu ntụpọ dị na omume mmadụ (PDR) | SSRF

1. Ihe na-eme na akụkụ ụwa niile

Biko lee ihe vidio anyị na iwepu ntụpọ dị na omume mmadụ ebe a:

Washington DC, USA: 8 AM

Mgbe John chefuru ebe o debere igodo ya n’ihi uche anọghị, ọ bụghị naanị igbu otu awa n’oge  ya ịgbalị n’ụjọ na-achọ ha, kama kpasuo nwunye ya iwe ka ọ na-atụgharị ụlọ na-achọ ịchọta ha

 

Dublin, Ireland 10 AM

Aisling chefuru ileta ofe ahụ o nwere na ọkụ ka ọ rapara n’ihe nkịrị soap opera kachasị amasị ya na televishọn. N’ihi adịghị arụ ọrụ ya na akpachapụghị anya ofe ahụ na-ere ọkụ na nri ehihie ka a ga-akwadebekwa ọzọ.

 

Otu ebe na South Korean Coast 9 AM – 11:30 AM

Ugbu a otu mmejọ na nnukwu ibu. Ndị na-anya ugbo mmiri na ndị na-ahụ maka ụgbọ mmiri MVSewol bufere ụgbọ ahụ ibu ihe karịrị ugboro atọ. N’ihi anaghị arụ ọrụ na anaghị eso usoro ụgbọ ahụ kwuburu kpuo mgbe ọ na-atụgharị, gbuo mmadụ narị atọ na anọ na ndị ọrụ n’ụgbọ mmiri ma mebie ibu ọnụ ahịa bụ otu nde na nnarị asaa ego ndị US.

Brazilia, Brazil 12 PM

Roberto gafere ọkụ okporo ụzọ uhie n’ihi enweghị ndidi ya na inwe nchekasị n’ọdịdị kpatara nnukwu ihe ọghọm merụrụ ezinụlọ Oliveira arụ.

 

 

Auckland, New Zealand 2 PM

Mgbe enyi Ellen Monique nwetara ezi ịhụnanya, Ellen kama inwe obi ụtọ maka ya ekworo eju ya arụ. Nke a na-akpata esemokwu na ọbụbụenyi ha ma na ikpa azụ mebie mmekọrịta n’ezie.

 

 

Rome, Italy 4 PM

Mgbe ọ nụrụ na nwunye ya pụrụ apụ n’ụbọchị ahụ agbanyeghị na ọ sịrị mba, o wutere mpako ya, iwe ewe ya, o yipụta eriri akwa ya wee tie nwunye ya ihe. Ime ihe ike n’ụlọ n’ihi iwe ya na-enwe mmetụta ọjọ na nwunye ya na ụmụ ya

 

Lisbon, Portugal 6 PM

Antonio enwebeghị ike iguzoro onwe ya n’ebe ọrụ ya ebe ọ na-enweghị obi ike ma nwee obi erughị ala, ya mere ọ na-enwe obi nkoropụ mgbe niile

 

 

Stockholm, Sweden, 7:00 PM

Julia na-echeta ihe omume na-egbu mgbu mere n’oge gara aga n’ihi oke nwute ọdịdị ya ma ọ na-ewetakarị ya anya mmiri

 

 

Dubai, UAE 11 AM

Okwu Imran dị nro n’ihi anyaukwu ya mere ka nwanne ya nwoke hapụrụ ya oke nke ihe ezinụlọ ya iji nyere ya aka inweta ego azụmaahịa na ekwesịghị ekwesị. Azụmaahia ahụ na ikpeazụ daa, Asif enweta nnukwu ego ifụ

 

New Delhi, India 9:30 PM

Ugbu amgbenwe nke otu mmejọ bụrụ nnukwu ibu. Jụpụtara na anyaukwu, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ emela atụmatụ ikpeazụ iji nyefee ọtụtụ nde kwuru nde dollars o nwetara site na ngarị na akaụntụ akụ nke Switzerland. Ọ bụrụ na otu ego ahụ ga-adịgide na India, enwere ike inye ọtụtụ nde mmadụ agụụ na-agụ nri otu ọnwa.

Ndịa bụ ọmụmaatụ nke mmejọ nke a na-ahụkarị n’ụwa niile; ụfọdụ ihe na-esi nay a pụta nwere ike bụrụ ihe jọgburu onwe ya ma dịkwa njọ. Anyị niile ga-enwe ike ịhụta onwe anyị na ụfọdụ ihe mmejọ ndị a egosịrị na mbu. N’agbanyeghị na ike ime nke a dị iche iche, mmejọ dịka ndị a bụ nke kachasị n’ihi ntụpọ nke omume dị na otu onye. Ntụpọ omume mmadụ bụ mmetụta ndị ahụ dị n’uche dịka mpako, iwe, anyaukwu na ịdị umengwụ nke akpali echiche na-adịghị mma, mmetụta na ihe omume ndị na-eweta enweghị obi ụtọ na ihe ọjọọ nye ma onwe gị ma ndị ọzọ.

2. Mmetụta nke mmejọ n’ọkwa otu onye

Ichetara oge ikpe azụ iwe were gị? O yikarịrị ka ọ bụghị na na nke ọbụla n’usoro ọmụmụ ihe  anyị, onye ọbụla na-aza nnukwu ‘mba’.

Ndị nwere nnukwu ntụpọ omume siri ike dịka iwe, umengwụ, ikpe na enweghị ike ịrụ ọrụ  bụcha ndị mmadụ obi anaghị adị ụtọ, uche ha nọ na-mgbagha mgbe niile. Omume niile na echiche ha niile nwere ụdị ntụpọ ndị a, na-ebute inye onwe ha na ndị ọzọ nsogbu.

3. Mmetụta na mmekọrịta chiri anya

Mmejọ (mmehie) anyị mere site na ntụpọ nke omume nwere ike imetụta ọ bụghị naanị onwe anyị na enweghị obi ụtọ kamakwa ndị gbara anyị gburugburu dịka ezinụlọ anyị, ndị ọrụ ibe anyị na ndị enyi anyị.

Mgbe ụfọdụ anyị na-eche na anyị bụ ndị ezi omume n’iweso ndị ọzọ iwe. Eziokwu n’agbanyeghị na ọ bụrụgodị na anyị chere na enweghị obi ụtọ anyị bụ n’ihi na mmadụ mejọrọ anyị, na-eburu onye ahụ iwe na emekwu enweghị obi ụtọ ọ bawanye n’onwe ya.

4. Mmetụta n’etiti ọha mmadụ

Ka ọnọdụ anyị na ọha mmadụ dị elu ma ọ bụ mmetụta na ebe ndị ọzọ nọ, ka ndị mmadụ nwere ike na-enwe mmetụta ọjọọ n’ihi ntụpọ omume mmadụ. Ntụpọ nke omume anyị na-akpali anyị ime mmehie na mmejọ na ikpe ikpe, ma ọ bụrụ site na mmejọ ndị a ndị mmadụ enwe mmewa obi, anyị ehukwasa onwe anyị iwu inye na inara na-adịghị mma, nsonaazụ nke anyị nwere ike ịnagide na-ịgba nje n’ụwa ya na mgbe a nwụsịrị.

5. Etu iwepụ ntụpọ omume (PDR) ga-esi nyere gị aka

Iwepụ ntụpọ omume  site na uche anyị bụ otu ụzọ dị mkpa iji bie ndụ obi aṅụrị ma nwekwa obi iru ala. Na usoro nkuzi a, anyị ga-azụ gị gbasara ‘Usoro Mwepu Ntụpọ Omume’ nke amakwara na mkpụrụ okwu dị ka ‘PDR’ Mgbe emere PDR mgbe niile ma n’ezi obi yana nmekọrịta nke omume ime mmụọ ndị ọzọ, anyị na-aga usoro inweta ihe onwe onye chọrọ, nke pụtara na o nwere ike ibulite mmadụ na ndụ kacha elu ma na-enyere mmadụ aka inwe ọganihu ime mmụọ ngwa ngwa. Mgbe ntụpọ omume dị ka iwe na anyaukwu belata n’ime anyị, ọbụghị naanị na anyị ga-erite uru ndị nwere obi aṅụrị  kama ndị ọzọ bịakwutere anyị na-eritekwa uru. Anyị na-anabata gị nke ọma ịnwekọrịta/isonye na SSRF mgbali inyere otu onye na mmadụ niile na iwepu ntụpọ omume yana iwepu mpako onwe onye.