Gịnị bụ Aṅuri kacha elu

Nkọwa aṅurị kacha elu

Aṅurị kacha elu bụ ọnọdụ kacha ọnọdụ nile karikwa ma aṅurị. Aṅurị anyi na- ekwụkari bụ n’ụzọ  ọzọ ma ọbụ nke dị na mpụga ụwa. Aṅuri kacha elu na nkọwa bụ, ihe anyi na- eme gbasara mkpụrụ obi na esịghị na- ezi na-akpalite.

Na ndụ, anyi chọpụtara na ihe ọbụla na-eme anyi aṅurị enwekwara ike ime anyi  enweghị aṅurị. Na ịga n’ihụ na nghọta nkea, anyi ga- agụ ụzọ anyi si enwe aṅurị.

Ha bụ:

  • Uche ise: Ndịa bụ ihe ụtọ e nwetara site na imetụ ata, ụsọ, ụda, isi m’ọbụ ịhụ.

N’imatụ: Onye hụrụ ihe nracha juru oyi n’anya ga n’achọ ije na obi ihe nracha. Ihe-nracha mbu mgbe nile na-atọkaricha. Ka ọ na aracha na aracha, ụtọ o nwetara na nke izizi na- agbada ganye  na o bido nwebe ahụ ngbakasị na nke ịsaa m’ọbụ nke ịsatọ ọ na aracha. Ya bụ ụtọ o nwetara na ihe- nracha enweghị ike ịnọgide. Anyi were ike  iji nke a tụnyere ihe ọbụla ọzọ a chọrọ na ndụ – Aṅurị anyi gbagoruo na isi ihe ọbụla, o bido mgbatụ.

  • Uche: Ọ bụ akụkụ echiche mmadụ nke jikọrọ omụme onye ahụ(omụme anyi na echiche anyi dịkọtara ọnụ n’onweha – echiche  enweghị aṅurị na -akpata ị nọ na  nweghi aṅurị, ịnọ na enweghi aṅurị na akpatakwa  echiche enweghị aṅurị). Ụtọ e nwetara site na uche ka dị elu karia nke e nwetara site na uche ise.

N’imatụ: Gini nwere ike ịbụ omụme ụtọ kachasị anyi nwere ike inwe? O nwere ike ịbụ i nweta onye Ị hụrụ n’anya. Yabu n’imatụ ka anyi were mmadụ n’abọ hụrụ onwe ha n’anya na-arọghị nrọ na ha ga- ebi ndụ ha na nkewa. Mgbe mmekọrita ha rụrụ na alụm di na nwunye, anyi ahụ na elu aṅuri ha enweghi ike idigide. Onye ọbụla n’ime ha ebido hụba onye nke ọzọ na ụzọ ọzọ, na oge na-adighi anya ha achọpụta na ọ dịghị onye ọzọ nwere ike ime ha ihe wụte karịa m’ọbụ ikpasụ iwe karia onwe ha bụrụkwa ndi n’enye onwe ha ezigbo obi ụtọ!

  • Amamihe: Nke a bụ ihe n’enyere anyi aka ịkpebi na ịkọwa ihe. Ọ na enyere anyi aka ị nweta ụdị ụtọ di iche iche nke dị mma ma buo ibụ dikwa elu karia aṅurị enwetara na uche.

N’imatụ: K’anyi were imatụ nke onye ọka mmụta sayensi were onwe ya tinye in inyopụta ihe. Ụgbụa, kwuo otu ụbọsị  o nweta ọsịsa ihe gbagojụrụ ndị mmadụ nile anya nnarị ahọ ole na ole gara aga – Yaa! mụọ ya ga-adị elu. Mana gịnị mere oke aṅurị ibuli elu ya mgbe ọ gara obele oge, itu ya aha agbadaa? Ụgbụa ọ nọzikwaghi n’elu – n’ezi okwu ọ nọzịghị na ezụmike, ebe ọ chọrọ ibido ihe ọhụụ ọzọ ọ ga-achọpụta. M’ọbụ nke ka njọ, o nwere ike banye obi nkoropu mgbe ọ chọpụtara na nnukwu nchọpụta( ima atụ: usoro ịkpa ike E=mc2) o wepụtara a burugo ihe eji wee gbuo ụmụ mmadụ sitena ihe a nakpọ “atom bomb”.

Gịnị bụ Aṅuri kacha elu

Ihe osise a gosiri etu aṅurị anyi nwetara site na ụzọ ọbụla ( ọ bụ, Uche ise, uche, na amamihe) si na agbago na abụghi sọ na ịdị mma kama ọbụkwazị ma na ịnọ tee aka

Otu o sina dị, mgbe anyi nwere aṅurị kacha elu na mkpụrụ obi, anyi aghọta na ọ bụ aṅurị kachasi elu na mma, na anọgidekwa agwu agwu.ọ dịghị okwu aga eji kọwa Aṅurị kacha elu, Ọ ka mma i enwe ya.

I gosi na o dịghị okwu a ga eji kọwa ya, K’anyi were ịma atụ ụtọ di na ọtọbụrịbụrị. O nwere ụzọ ọbụla anyi nwere ike iji okwu kọwara onye enweghị ire ụtọ dị na ọtọbụrịbụri? Mba! Anyi ahụghị okwu ọbụla kọwara n’ezie ụtọ dị na ọtọbụrịbụrị . Otu ọ dị na aṅurị kacha elu, na i ga enweriri ụtọ ka i wee ghọta. Omume n’ime mụọ bụ nanị ụzọ a ga-eji nweta na ghọta ihe bụ aṅuri kacha elu.