Mwepụ ntụpọ omume dị ka omume ime mmụọ

1. Mmetụta ọjọọ nke ntụpọ omume na omume mmadụ na omume ime  mmụọ

Enwere okwu dị n’ime akwụkwọ nsọ ochie nke na-ekwu na:

Uche ka ọ dịrị ijikọta ma mmadụ ma nnwere onwe ya kachasị site na okirikiri nke ọmụmụ na ọnwụ, ma ọ bụ obi aṅụrị na obi enweghị aṅụrị.

Dịka anyị hụrụ n’isi akwụkwọ ndị bu ụzọ ntụpọ omume dị na mmadụ na-akpata enweghị obi aṅụrị, ebe agwa ọma ya na-enye aka na-enwe obi aṅụrị na afọ ojuju ya. Ntụpọ omume na omume ọma nke otu onye  na-emetụtakwa ọha mmadụ ọkachasị ọ bụrụ na mmadụ nọ n’ọnọdụ na-emetụta ọha mmadụ. Taa intaneti na mgbasa ozi na-ewu ewu, ogo otu onye nwere ike isi metụta ndị ọzọ n’ụwa niile amụbawo nke ukwuu. Ntụpọ omume mmadụ niile na-ebute inye mmadụ na ndị ọzọ enweghị obi aṅụrị nakwa ime ka mmadụ nọrọ sọ na-ile ndụ anya. Otu ọ dị ewezuga obi enweghị aṅụrị enwekwara mmegharị ọjọọ nke ime mmụọ dị na ntụpọ mmadụ. Ka anyị leba anya n’ihe na-eme onye na-achọnụ na agba mbọ ime omume ime mmụọ ma nwee ọtụtụ ntụpọ omume.

  1. Enweghị ntinye uche: SSRF na-akwado ụzọ nke ime mmụọ nke amara Guru nke nwere usoro asatọ na-omume ime mmụọ. Ọ bụ ezie na ịkpọkụ Aha Chineke bụ ntọala nke ụzọ ime mmụọ a, ọ na-esi ike imepụta etiti nke ịkpọkụ (etiti ofufe) n’ime uche a na-amachaghị dịka o jụpụtara na ntụpọ omume na mpako nke onwe. N’ihi ọtụtụ ntụpọ omume onye na-achọnụ enweghị ike itinye uche na ịkpọkụ nke ọ na-akpọkụ. N’eziokwu n’ihi ntụpọ omume mmadụ, ọ na-esi ike itinye uche n’ụdị omume ime mmụọ ọ bụla.
  2. Enweghị ike ịgwakọta ọnụ na Chineke: Ihe mgbaru ọsọ kachasị na omume ime mmụọ bụ ngwakọta ọnụ n’ime Chineke. Otu ọ dị, dị ka otu nda mmanụ enweghị ike ịgwakọta n’ime mmiri n’ihi ihe dị iche iche dị n’ọdịdị ha, n’otu aka ahụ, maka onye nwere ọtụtụ ntụpọ nke omume, ọ gaghị ekwe omume ịgwakọta  n’ime Chineke  nke enweghị ntụpọ ma bụrụ omume ọma niile.
  3. Enweghị afọ ojuju site na omume ime mmụọ:Onye na-achọnụ  nwere ọtụtụ ntụpọ omume na mpako nke onwe dị elu enweghị ike inwetanata afọ ojuju site na omume ime mmụọ dị ka omume ọjọọ ya ga na-anọchiri ya ụzọ oge niile.
  4. Nchịkwa nke ike adịghị mma: Onye dị otu ahụ na-achọnụ nwere ike igbanwee ngwa ngwa, na ọbụladị ike mgbakasị ahụ sitere na mpaghara ime mmụọ na-achịkwa ya dị ka ha na-ewere ọtụtụ ntụpọ omume ya na mpako nke onwe ya ka ihe enyemaka.
  5. Mbelata ikike maka omume ime mmụọ: Mmejọ nke onye na-achọnụ na-eme n’ihi ntụpọ omume  na mpako nke onwe ya na-ebelata ike e enwetara site na omume ime mmụọ, ikike ya na arụmọrụ ya na-adakwa ada.

2. Ịdị mkpa nke iwepu ntụpọ omume na omume ime mmụọ

N’ihi ebumnuche niile dị n’elu onye na-achọnụ nwere ọtụtụ ntụpọ omume anaghị aganihu ma tọọ na okirikiri nke ọmụmụ na ọnwụ.

Ọ bụ maka ebunuche a ka Onye Nsọ Dr Athavale ji na-enye nduzi ndị a na-esote

Iji ganihu n’ime mmụọ, ọ dị mkpa iwepu ntụpọ omume na mpako nke onwe n’ụzọ ọ bụla onye na-achọnụ ga-eso dị ka ụzọ nke omume (Karmayoga), ụzọ nke ofufe (Bhaktiyoga), ụzọ nke ọmụma (Dnyanyoga), ụzọ siri ike nke ịma ụma họrọ (Hathayoga), ụzọ nke yoga (Kundaliniyoga), na ndị ọzọ ga. Ndị mmadụ n’oge mbu nke SatyayugTretayug na Dwaparyug nwere ma atulee ya nnukwu obere  ntụpọ omume na mpako nke onwe. N’oge ugbu a nke Kaliyug ọtụtụ ndị mmadụ anaghị aganihu na mmụọ n’ihi nnukwu ntụpọ omume na mpako nke onwe dị njọ. Ya mere onye na-achọnụ na-eso ụzọ ọ bụla nke omume ime mmụọ, kwesiri imalite na nkpochapu ntụpọ omume na mpako nke onwe ya.

– (Paratpar Guru) Onye Nsọ Dr Jayant Athavale
(28 May 2015)

Usoro asatọ nke omume ime mmụọ dịka Ụzọ nke amara Guru gụnyere:

  1. Mwepu ntụpọ omume
  2. Satseva: Ijere Eziokwu Zuru Oke ozi
  3. Naam:Ikpọkụ Aha nke Chineke
  4. Satsang: Ịnọnye na mkapakọrịta nke Eziokwu Zuru Oke
  5. Tyag: Ịchụ aja maka irukwuru Chineke
  6. Priti: Ịhụnanya nke ime mmụọ maka mmadụ niile
  7. Bhavjagruti: Mmalite mmetụta ime mmụọ
  8. Mwepu mpako nke onwe

Rue ugbu a, maka ndị na-amalite ime omume ime mmụọ ọhụrụ a na-ewere ‘Naam’, ‘satsang’ na ‘satseva’ ka ndị ka dị mkpa n’ime usoro asatọ nke omume ime mmụọ. Otu ọ dị ugbu a dịka oge ahụ na ịghọta mkpa ọ dị ikpochapu ntụpọ omume na mpako nke onwe, ndị na-achọnụ kwesiri ịgba mbọ ime omume ime mmụọ n’usoro ndị, ya bụ, ‘iwepu ntụpọ omume’, ‘satseva’, ‘Naam’, ‘satsang’, ‘tyag’, ‘priti’, ‘mmalite mmetụta ime mmụọ’ na ‘iwepu mpako nke onwe’. Mgbe onye na-achọnụ ji obi ya niile na-eme ‘mwepu ntụpọ omume’ na ‘mwepu mpako nke onwe’ dị ka omume ime mmụọ ya na omume ime mmụọ ndị ọzọ, uto ime mmụọ ka a na-enweta ngwa ngwa.