Kedụ ka a ga-esi banye n’aṅurị kacha elu dị na mkpụrụ obi ?

Kedụ ka a ga-esi banye n’aṅurị kacha elu dị na mkpụrụ obi ?

N’ime usoro nke ịto n’ime mụọ anyi na-enweta  ikike nke ibanye na inweta  aṅurị kacha elu (Ānand) n’ime mkpụrụ obi (ātmā). Onye ọbụla n’ime anyi nọ ebe dị iche iche nke uto n’ime mụọ. Ogo na ogologo oge aṅurị kacha elu a dịnọọ nhata na ogo nke uto ime mụọ onye ọbụla nwere.

Ụtụtụ ọbụla mgbe anyị lere anya na ụgegbe, anyi amarago ịhụ inyinyo onwe anyị. Mana ichenugo echịche banyere ihe ị ga-adị ka ya ma ọbụrụ na ịnwere ike ihu inyinyo mkpụrụ obi gị ?

Anyị na-akpọ ya Mkpụrụ obi yii ahụ dị ka ọka mmụta sayensị nke ime mụọ ebe ọ bụ na o chefuola onwe ya dị ka “Mkpụrụ obi”wee n’eche onwe ya ka ọ bụ uche ise, uche na amamihe. Mkpụrụ obi a dịghị ahụ anya ( ya bụ ewepu ahụ an’ahụ anya n’ikpazu mgbe mmadụ nwụrụ) a na-akpọkwa ya mkpụrụ obi yii ahụ ma ọbụ jiva.

Nke a bụ ime inyiyno etụ onye nkịtị dị na ụwa taa.

Anyị nwere ike ịnwe ihe kasị ihe n’ime anyi, ya bụ mkpụrụ obi, mana ọ bụrụ na-ewere nnukwu akwa kpụche ya bụ ihe kachasi ihe ọ dịghịkwazị  ihe ọbụla a ga ahụta. Ọchịchị a nke gbachiri mkpụrụ obi anyi gbụrụ-gbụrụ bụ “amaghị ihe ime mụọ” na ezị ọnọdụ anyi bụ aṅurị kachasị elu. Amaghị ihe ime mụọ na-ekwu maka etu anyi enweghi ike ihụ ihe gafee uche ise anyi, uche na amamihe wee banye n’ime mkpụrụ obi anyi. Mgbe anyị (mkpụrụ obi yii  ahụ) malitere ime ma ọbụ na-eme omume ime mụọ mgbe ahụ ochichi ebido mbenata, anyi enwe ike ihutatụ mkpụrụ obi bịa n’enwekwa aṅurị kacha elu. Na mputa, anyi na- edebe ụlọ  anyi ọcha na-awụcha ahụ anyị ụbọchị nile maka na ana’hụ unyii dị na mpụta anyị ọsọsọ. Otu ọ dị ịdebe ime mụọ ọcha bụ ihe ọzọ na- adịghị adịkebe.

Kedụ ka a ga-esi banye n’aṅurị kacha elu dị na mkpụrụ obi ?

Ọ bụrụ n’anyi amalite mebe omume ime mụọ mgbe nile anyi ebido nwebe metụta nke ahụmahụ di ebube nke Chineke nke amara dị ka ahụmahụ ime mụọ. Anyi ga-aga n’ihụ kọwa ụfọdụ ahụmahụ ndị a.

Ọnọdụ ikpasụ bụ nke Shivdashā ( ya bụ, ọnọdụ nke ịdị n’otu na Chineke ma ọ bụ mmekọrịta mgbe nile na Chineke). Ọnọdụ ikpasụ a na-abịa mgbe e wepụchara ihe nile kpụchוֹrוֹ mkpụrụ obi ọ dị ọcha wee chawapụta na-enwu site n’enweghị ihe nzacha nke amaghị ihe ime mụọ.

Kedụ ka a ga-esi banye n’aṅurị kacha elu dị na mkpụrụ obi ?