Ihe a chọrọ na ndụ

1. Okwu mmalite maka ihe a chọrọ na ndụ.

Oge nile anyi na-anụ otu ajụjụ na ụzọ dị iche, ‘Kedu ihe ndụ pụtara?’ Ma ọbụ ‘Gini ka anyị chọrọ na ndụ?’ ma ọbụ ‘Gini ka e ji mụọ anyi?’ N’ọtụtụ ọnọdụ, anyị nwere nchịkọta nke onwe anyi na ihe anyị chọrọ na ndụ. Otu ọ dị site n’ọnọdụ ime mmụọ, e nwere ihe abụọ kpatara ihe mere eji amụọ anyi. Ihe ndị a na- akọwa a chọrọ na ndụ anyị na okwa kachasi elu. Ha bụ:

  • Iji mezue ndekọ inye na inara anyi ji ọtụtụ ndị mmadụ.
  • Iji mee ọganihu ime mmụọ wee nweta ebumnuche ikpeazụ bụ ịbanye n’ime chineke, wee si na- igbanje ọmụmụ na ọnwụ pụta.

2. I Mezu ndekọ ịnata na ịnye anyi ji

 N’ime ọtụtụ ndụ, anyị na-enweta ọtụtụ ndekọ inye na inara nke si ozigbo na ihe anyi metara. Ihe ndekọ ahụ nwere ike ịdị mma ma ọbụ njọ dị ka otu omume ọlụ anyi si dị mma ma ọbụ njọ. Dị ka usoro isi, n’oge a ekee ndụ ihe dị ka nnarị, ndụ anyị iri isii na ise bụ akara aka (ọ bụghị n’ime uche anyị), mana iri atọ na ise ndụ anyị ka anyi ji nwere onwe achikwa. Ihe nile dị mkpa na ndụ anyị buru ibu bụ akara aka. Ihe ndị a gụnyere ọmụmụ anyi, ezinụlọ amụrụ anyị, onye (ma ọbụ ndị) anyị na-alụ, ụmụ anyị nwere, ọrịa ọjọọ na oge ọnwụ. Aṅurị na ihe mgbu anyị na-enye ma na-enweta n’aka ndị anyị hụrụ n’anya na ndị anyị maara bụ nnukwu ihe nke bu ụzọ na ndekọ וֹnye na ịnara nke na-egosi ma kọwa ụzọ mmekọrịta si adị.

Ihe a chọrọ na ndụ

Otu ọ dị akaraka anyị na oge ndụ nke a bụ okere nke ngbakọta ndekọ inye na ịnara nke anyị kpokotara n’ime ọtụtụ oge ndụ gara aga.

Na oge ndụ anyị, mgbe anyị na-emezụ ndekọ inye na ịnara na akaraka e dere anyị maka oge ndụ nke a, anyị na-ejedebe na imepụta ihe ndeko ndị ọzọ site na iji arụmọrụ nke anyị. Nke a na- ikpazụ na- agbakwunye na mkpokọta ndekọ inye na inara amara dịka nchịkọta ndekọ. N’ihi ya, a ga- amụ anyị ọzọ mgbe anyị nwụsịrị iji dozie ndekọ inye na ịnara, nke na-ejide na igbanje ọmụmụ na ọnwụ.

lee na edemede nke  ‘ịtọpụ ịgbanje nke ọmụmụ na ọnwụ’ nke kọwara etu esi na-ejide anyị na- igbanje ọmụmụ na ọnwụ.

3. Ime ọganihụ ime mụọ

Samashti ọkwa ime mụọ na egosi ọkwa ime mụọ nke enwetara site na omume ime mụọ maka ndị mmadu (samashti sādhanā), ebe vyashti omume ime mụọ na egosi ọkwa ime mụọ nke enwetara site na omume ime mụọ otu onye (vyashti sādhanā). N’oge a, ọganihụ ime mụọ maka ndị mmadụ dị mkpa iri isa ma ekee ya nnarị ebe omume ime mụọ nke otu onye dị mkpa iri atọ

Isi njedebe nke ibawanye na ime mụọ nke ụzọ ime mụọ ọbụla bụ ibanye n’ime Chineke. ‘ibanye n’ime Chineke’ pụtara inweta Chineke n’ime anyị ya na ụgbụrụ gbụrụ anyị na achọpụtaghị onye anyị site na uche ise anyị, uche, na amamihe.Nke a na-eme mgbe ọkwa ime mụọ bụ nnarị ma ekee ya nnarị. Ọtụtụ ndị mmadụ n’uwa taa, ekee ya nnarị nọ na iri abụọ ya na iri abụọ na ise na ọkwa ime mụọ, ha anaghị eme omume ime mụọ ọbụla maka ịbawanye na ime mụọ.Ha na- amata onwe ha nke ukwuu site na uche ise ha, uche na amamihe.Nke a na-egosipụta na ndụ anyị mgbe anyị tinyere uche anyị ọkachasị na etu anyị dị n’anya ma ọ bụ dị mpako gbasara ọgụgụ isi anyị ma ọ bụ ihe  iga nke ọma.

Site na omume ime mụọ mgbe anyị na-eto eto na nke ime mụọ rụo iri isi (samashṭi) ma ekee ya nnarị ma ọ bụ iri asaa (vyashṭi), a tọhapụrụ anyị na-igbanje nke ọmụmụ na ọnwụ. mgbe ọkwa ime mụọ nke gasịri, anyị nwere ike ikwughachị ihe ọbụla fọdụrụ na ndekọ nke inye na ịnara anyị nwere na uzọ anaghị ahụ anya dị elu nke Maharlok.  Mgbe ụfọdụ otu ọ dị, mmadụ nke nọ karịa iri isi ma ekee ya nnarị (samashti) ma ọ bụ iri asaa ma ekee ya nnarị (vyashti) na ọkwa nke ime mụọ were ike ikpebi ka amụọ ha n’uwa iji duzie ụmụ mmadụ na ime mụọ.

Ihe a chọrọ na ndụ

Ịbawanye n’ime mụọ bụ nanị site na ime omume nke ime mụọ nke kwenyere na isi isii ụkpụrụ nke omume ime mụọ  Uzọ nke ime mụọ na ekwenyeghị na isi isii ụkpụrụ nke omume ime mụọ na-eduba mmadụ na ịnọrọ otu ebe etoghị eto na mbawanye nke ime mụọ.

lee na edemede nke Mkpa ọ dị n’elu ụwa na enwere ike ime omume nke ime mụọ na ya  tunyere ebe ime mụọ ndị ọzọ dị ka eluigwe na ọkụmụọ.

4. Kedụ ihe nke a pụtara gbasara ihe anyị chọrọ ibụ/ime na ndụ?

Ọtụtụ n’ime anyị nwere ihe anyị chọrọ na ndụ. Ha nwere ike ịbụ dịbịa oyibo, inwe akụ na ụba na ibụ onye amama ma ọ bụ na anọchite anya mba ya na mbaghara ụfọdụ. Ihe ọbụla anyi chọrọ maka ọtụtụ n’ime anyị, ọ na abụkarị ihe ụwa. E guzobere usoro mmụta anyị nile iji nyere anyị aka inweta ihe ụwa. Dị ka nne na nna kwa, anyị na etinyekwa ihe ụwa na ụmụ anyị site na ịkwado ha ka ha gụọ na banye ọlụ nke ga-enye ha ụrụ na-adịghị nteaka iji tunyere ụlọ onye ahụ chọrọ.

O nwere ike ijụ, “Kedu ka inwe ihe nke ụwa ga-esi kpezie ya na ihe nke ime mụọ e ji maka ya wee mụọ anyị na ụwa?”

Asịsa nke a dị nfe. Anyị na-agba mbọ maka ihe nke ụwa anyị chọrọ ime na mbụ iji nweta afọ ojuju na aṅurị. Ịchụ ihe a siri ike inwe ‘aṅurị kacha elu na-adigide’ bụ ka esi kee anyị na akwanye anyị ime ihe ọbụla  anyị na-eme. Otu ọ dị ma mgbe anyị mezụrụ ihe nke ụwa ahụ anyị chọrọ ime, aṅurị na afọ ojuju si na ya pụta na-adị mpe, mgbe ahụ anyị achọba nrọ ọzọ anyị ga-achụ.

Aṅurị kacha elu na-adigide’ na-abịa nanị site na-ime omume ime mụọ nke dabanyere na isi isii ụkpụrụ nke omume ime mụọ.  Aṅurịdị karisiri elu bụ  Aṅurị kachasi elu  (Ānand) bụ otu agwa Chukwu. Mgbe anyị bụrụ otu n’ime Chineke anyị na onye anyị enwe aṅurị kachasi elu na-adịgide.

Nke apụtaghị na anyị ga- ahapụ ihe anyị nwere ime ma nọgịde sọọ na- ime omume nke ime mụọ.Ihe ọ pụtara bụ na site na imalite omume ime mụọ na njịkọ ndụ ụwa ka anyị nwere ike inwe aṅurị kachasị elu na-adịgide. Ụrụ dị na omume ime mụọ ka ekwugoro  n’uju na-ebe anyị kwụrụ maka ‘Nchọpụta ime mụọ maka aṅurị na-adịgide.

Na nkenke, Ka ihe anyi chọrọ na ndụ na-adabanye na ihe ibawanye nke ime mụọ, ka ndụ anyị na-akawanye mma ahụmahụ ihe mgbụ na ndụ anyị ebenata. Nke a bụ otu imatụ etu nghọta anyị maka ndụ sii na-agbanwe ka anyi na ebu na eto n’ime mụọ.

Nghọta nke ụwa Na Nghọta nke ime mụọ

N’anya nke ụwa N’anya nke ime mụọ
Gịnị bụ amaghị ihe? Enweghị amamihe nke ihe ụwa Nkwenye na ‘mụ’ bụ ahụ ma ọ uche
Gịnị ka ima onwe onye pụtara? Inweta agwa ọma na nke ọjọ dị adị ana ahụ anya, nke uche na nke akọ nke onwe ya. Nchọpụta na ‘mụ’ bụ Chụkwụ nọ n’ime na nweta ya.
Kedu ka esi akọwa ihe ọma? Inweta nsọpụrụ, ego, aha, na ndị ọzọ. Ime oganihụ ime mụọ

5. Imatụ etu ibi ndụ nke ụwa ga-esi nwe ike ịrụ ọrụ na ihe ndụ ime mụọ achọrọ

Na SSRF, anyị nwere ndị ọrụ anaghị akwụ ụgwọ, ndị na-efe Chineke site na inye oge ha na ọrụ ha. N’imatụ:

  • Otu onye n’ime anyị bụ onye ndụmọdọ na ihe gbasara nka n’ụzụ na izipụ ozi na ikuku mgbe o nwere ohere.
  • Otu onye na ndị na-enene ihe a ga-ezipụ bụ dịbịa oyibo n’ahụ maka ọrịa uche. Ọ na enye aka inene ozi ndị a ana- ezipụ site na ụzọ gbasara ahụike na nke ime mụọ.
  • Onye otu SSRF ọzọ na-aga njem ọrụ na mba dị iche iche. Ọ na eji oge o nwere ohere na-agwa ndị otụ ọzọ dịkwa ka SSRF na mba ahụ  ihe gbasara ozi ikuku.
  • nwanyị ezi na ụlọ na-enye aka na ikwado ihe oriri mgbe enwere ọgbakọ maka ihe ime mụọ.

Ndị otu SSRF ahụgo nnụkwụ ihe dị mma na-agbanwe na ndụ ha mgbe ha na-efesasi ihe nke ime mụọ na ndụ ha nile. Otu nnụkwụ ihe dị iche bụ ọganihụ na inwe aṅurị na mbenata na mwute. Ma mgbe onye otu SSRF zụtere ọnọdụ dị ahụhụ ma ọ bụ mberede, ha enwego  nchekwa nke ihe mgbu ahụ.

6. Kedu ihe na-ezighi ezi na ịmụ mmadụ ugboro ugboro?

Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-eche, “Kedu ihe na-ezighi ezi na ịmụ mmadụ ugboro ugboro?”

Ka anyị na-abanye n’ime ime nke Kaliyug (ụwa esemokwu), oge a oge nke eluigwe na ala, ndụ ga-ejupụta na nsogbu na mgbu. Nnyoko e ji achọpụta ihe n’eme na ime mụọ gosiri na n’ ime uwa nile, e ekee oge ụzọ nnari, mmadu na anọ n’aṅuri mgbe nile oge iri atọ, ebe ọ n’anọ n’iwe na oge iri anọ. Oge iri atọ fọrọnụ, onye ahụ nọ na etiti, ọ nọghị n’aṅurị,ọ nọghikwa n’iwe. N’ imatụ, mgbe mmadu na-aga na ụzọ ma ọbụ na-eme ihe o jighị oke uche eme ya na mgbe ọ naghi eche echiche maka aṅuri ma ọbụ iwe.

Ihe mbu na akpata nke a bụ maka na ọtụtụ ndị mmadụ nọ na obele ọkwa ime mụọ. Ya mere na ihe anyị kpebiri ime na ihe anyị na-eme mgbe ọbụla na-enye ndị ọzọ ihe mgbu ma ọ bụ ganihụ na mụbaa Raja and Tama na gburugburu ebe obibi. N’ihi nke a, na-njedebe anyị na-ekpokoba ihe adịghị mma karma ma ọ bụ ndekọ nke inye na ịnara. Ya mere na ọtụtụ ndị ụmụ mmadụ, ọmụmụ anyị ndị sochirinụ ga-abụ ihe na-egbu mgbu karịa nke ndụ anyị ugbu a.

Ebe uwa megoro nnukwu usoro na akụ  na ụba, ọka mmụta na nka n’uzu iganihụ, anyị bụ ogbenye karịa ọgbọ gara aga na inwe aṅurị nke bụ ihe kachasị mkpa na ndụ anyị.

Ka ewere ya na anyị nile chọrọ aṅurị; ịmụọzọ na ndụ n’abịa agaghi enye anyị aṅurị kachasi elu na- adịgide bụ ọchịchọ anyị. Nani ito n’ime mụọ na ibanye n’ime Chineke ga-enye anyị aṅurị na-adịgide na-adịghị agwụagwụ.