What are humans comprised of?

1. Okwu mmalite ihe eji mee mmadụ

Na edemede nke a anyị na-akọwa ihe dị n’ime ahụ mmadụ na ihe ndị soo ya adịghị ahụ anya. Oka mmụta ugbu a abanyego n’ime iji ghọta ahụ an- ahụ anya. Mana nghọta ha na-akụkụ ọzọ mmadụ nwere ka adị obere. N’imatụ nghọta uche na akọ ndị mmadụ jedebere na akụkụ ahụ ha an-ahụ anya. Na-aka nke ọzọ, ọka mmụta ime mụọ amụgo ihe nile gbasara ka mmadụ dị na-ụjụ.

2. Gịnị ka eji mee mmadụ dịka ọka mmụta ime mmụọ si kọwa ya?

Mmadụ dị ndụ nwere ahụ ndị a.

  1. Akụkụ ahụ niile (sthūladēha)
  2. Ike ahụ (prāṇadēha)
  3. Echiche uche ahụ (manodēha)
  4. Amamihe ma ọ bụ anụ ahụ nkịtị (kāraṇdēha)
  5. ‘Mụ’ onwem ma ọ bụ anụ ahụ dị elu anaghị ahụ anya (mahākāraṇdēha)
  6. Mkpụrụ obi ma ọ bụ ụkpụrụ Chineke n’ime ụmụ mmadụ (ātmā)

What are humans comprised of?

Na mpaghara ndị sochịrịnụ, anyị ga-akọwa akụkụ ahụ dị iche iche ndị a n’ụzọ zuru ezu.

3. Ahụ nkịtị an’ahụ anya

Nke a bụ ahụ nke ndị ọka mmụta ugbu a mara nke ọma. O nwere ọkpụkpụ, akwara, anụ ahụ, imeju, ọbara, uche ise, na ndị ọzọ.

4. Ike nke ahụ

Nke a bụ ahụ amara dị ka pranadeha. Ahụ a na-enye ike, ndụ na-enye aka maka ọrụ niile nke anụ ahụ nakwa nke uche ahụ. E nwere ike nke ahụ ise ma ọ bụ praana:

  • Prāna: Ike maka ọrụ nke  ekuba ume
  • Udāna: Ike maka ọrụ nke ikụpụta ume
  • Samāna: Ike maka ọrụ nke afọ na eriri afọ
  • Vyāna: Ike nke ima ụma na amaghị ụma na- emegharị nke ahụ.
  • Apāna: Ike maka ịnwụ nwa amịrị, inwụ nsị, igbapụta mkpụrụ nwoke, imụ nwa na ndị ọzọ.

Na oge ọnwụ ike nke ahụ na-alaghachi azụ na Eluigwe na Ala na-enyekwa aka na  ibụgharị ahụ anaghị ahụ anya na njem mgbago ya.

5. Uche ahụ ma ọ bụ uche

Uche ahụ ma ọ bụ uche bụ ọnọdụ nke mmetụta anyị, mmetụta uche na ọchịchọ. N’ime ya bụ ọnụ ọgụgụ apụghị igụ ọnụ  nke echiche si na ndụ a na ndụ ndị gara aga. O nwere akụkụ atọ:

  • Eche uche: Ọ bụ akụkụ nke echiche na mmetụta anyị nke anyị mara na-anyị na-eche.
  • Akụkụ Echiche efu: O nwere echiche niile a chọrọ iji mezuo akaraka anyị na oge ndụ nke a. Echiche ndị si na akụkụ nke anyị amachaghị na anyị na-eche ụfọdụ oge na-abịa n’ime echiche nke anyị mara na anyị na-eche site na oge ruo na oge ma ọ bụ site na nzaghachi nke si na nkpalite mpụga ma ọ bụ ụfọdụ oge o sighi na ya. N’imatụ n’ime ụbọsị mmadụ na-eche mgbe ọbụla ọtụtụ echiche na-enweghị isi maka omume ya na nwata mgbe ọ bụ nwata.
  • Echiche efu: Nke a bụ akụkụ echiche anyị ndị anyị amadịghị cha cha. Nke a nwere echiche niile ndị gbasara ngbakọta ndekọ anyị.

Akụkụ echiche efu na echiche efu ka amara na otu dị ka Chitta.

Oge ụfọdụ anyị na-akpọkwa akụkụ uche ahụ ka ọhịchọ ahụ ma ọ bụ vāsanādeha. Nke a bụ akụkụ uche nke nwere echiche niile nke ọchịchọ.

Biko jee na edemede nke ‘Gini mere anyị ji eme ihe ndi anyị na-eme’ yana ọzụzụ ịntanetị nke ha nwere otu aha iji ghọta etu uche si arụ ọrụ.

Anụ ahụ nke ana ahụ anya metụtara uche ahụ bụ ụbụrụ.

6. Amamihe

Anụ ahụ nkịtị ma ọ bụ amamihe bụ ahụ nke metụtara usoro mkpebi na ike iche echiche. Anụ ahụ nke ana ahụ anya metụtara amamihe ahụ bụ ụbụrụ.

7. ‘Mụ onwem’ 

‘Mụ onwem’ ma ọ bụ anụ ahụ di elu anaghị ahụ anya bụ okpukpu nke ikpeazụ nke enweghị ọmụma. Ọ bụ mmetụta n’anyị na Chukwu nọ na-mkewa.

8. Mkpuru obi

Mkpụrụ obi bụ ụkpụrụ Chineke n’ime anyị na ezị ọdịdị anyị. Ọ bụ isi akụkụ nke ahụ adịghị nhụta nke bụ obere akara nke isi ụkpụrụ Chineke kachasị elu na agwa nke eziokwu zụrụ oke (Sat), Ọmụma zụrụ oke (Chit) na Aṅurị kacha elu (Ānand). Mgbago na mgbada dị na uwa anaghị emetụta mkpụrụ obi na ọ nọ na ọnọdụ ebịghị ebị nke aṅurị kacha elu. Ọ na- ele anya na mgbago na mgbada nke ndụ dị na nnukwu ụgha (Maya) dị ka onye na-ekịrị ihe. Mkpụrụ obi karịrị ihe atọ dị mkpa adịghị ahụ anya; otu ọ dị ihe ọmụma anyị dị ka arụ ahụ na uche ahụ bụ ya ka eji mee ha.

9. ‘Mụ’ onwem

‘Mụ’ onwem bụ akụkụ ọdịdị anyị ma ọ bụ ihe ọmụma anyị nke na-ahapụ ahụ anyị n’oge anyị na-anwụ anwụ. O nwere uche ahụ, anụ ahụ nkịtị ma ọ bụ amamihe, anụ ahụ di elu anaghị ahụ anya ma ọ bụ ‘Mụ’ onwem na Mkpụrụ obi. Ihe fọdụrụ n’azụ n’oge anyị na-anwụ anwụ bụ anụ ahụ anyị. Ike nke anụ ahụ na-anaghachị azụ na eluigwe na ala.

Ndị na-esonụ bụ akụkụ ndị ọzọ nke ahụ adịghị nhụta

  • Eciche ahụ adịghị nhụta: Site na echiche ahụ nke adịghị ahụta anyị na-ekwu maka echiche ise nke ahụ anyị anyị ji enwta ihe na-eme na ụwa adịghị ahụ anya site na nke anyị nwere ike inweta ebe adịghị ahụ anya. N’imatụ anyị na-enwe ike inweta isisi ọma di ka Jasmin mgbe ọdịghị ihe nkpalite ọbụla kpatara ya. Ọzọkwa otu onye nwere ike inweta isii ọma n’ime ụlọ ebe onye nke ọzọ nọkwa na otu ụlọ ahụ anaghị enweta ya. A ga- akọwa nke a n’uju. Ọzọkwa jee na edemede anyị nke – Gịnị bụ uche isii?     .
  • Ahụ mmegharị adịghị nhụta: Site na ahụ mmegharị adịghị nhụta anyị na-ekwu maka akụkụ ahụ anyị na-eme mmegharị dị ka aka anyị, ire, na ndị ọzọ. Ọrụ niile na-ebido isisi na ahụ mmegharị nke adịghị ahụ anya wee banye na ime ahụ mmegharị nke ana ahụ anya.

10. Enweghị ọmụma ihe

Ihe ọmụma ndị ọzọ dị na anyị karịa nke mkpụrụ obi bụ akụkụ nke nnukwu ụgha. A na-akpọ ya enweghị ọmụma (Nescience) ma ọ bụ Avidyā nke a pụtara n’ụzọ nkịtị na enweghị ihe ọmụma. Okwu a bụ ‘Nescience’ sitere na eziokwu ahụ bụ na anyị na-amata onwe anyị na akụkụ ahụ niile, uche na amamihe na a bụghị n’ezi ọdịdị anyị bụ mkpụrụ ma ọ bụ ụkpụrụ Chineke n’ime anyị.

What are humans comprised of?

 

Enweghị ọmụma bụ isi ihe kpatara iwe. Mmadụ na-enwe mmasị na ego, ụlọ nke ya, ezi na ụlọ, obodo, Mba na ndị ọzọ. Ka ọ na-agbakwunye onwe ya na onye ọbụla ma ọ bụ ihe ọ bụla nke ukwuu ka ọ gaghị na- enwe aṅurị nke ukwuu site na mmasị. Ọbụna ezigbo onye ọrụ obodo ma ọ bụ onye nsọ nwere ike ịnwe mmasị na ndị ọha mmadụ ma ọ bụ ndị na- efe ya. mmasị kachasi nke onye ọbụla nwere bụ onwe ya; ya bụ uche na ahụ ya. Ọbụna obere ihe nkasi obi ma ọ bụ ọrịa nwere ike ime ka obi ghara ịdị onye ahụ mma. Ya mere na onye ọbụla ga eji nwayọ tọpụ onwe ya na mmasị nke onwe ya. Nabata ihe ngbu na ọrịa na otu ukwu. Nke a ga-abụ nezie site na ịghọta na aṅurị na iwe na ndụ na-abịa isisi site na akaraka anyị. Ọzọkwa na ọ bụ site na imata mkpụrụ obi ka anyị ga-enwe aṅurị kacha elu na-adigide adịgide.

Mpụrụ obi na enweghị ọmụma gbakọtara bụrụ mkpụrụ obi nwere ahụ. Enweghị ọmụma maka onye dị ndụ nwere akụkụ iri abụọ na ha niile – akụkụ ahụ niile, uche echiche ise nke ahụ adịghị nhụta, akụkụ ahụ ise nke mmegharị adịghị nhụta, Ike ise ahụ, uche echiche   amara, uche echiche amaghị, amamihe na ‘mụ’ onwem. Ebe akụkụ ahụ ndị adịghị nhụta na-alụ ọrụ mgbe niile, a na-adọta anya nke mkpụrụ obi nwere ahụ ọ dị na ha na- enweghị ọmụma kama ọ ga-adị na mpkụrụ obi nke mara ihe nke ime mụọ.