Ima onwe onye bụ usoro mbu na mmepe omume mmadụ

1. Okwu mmalite nke mkpa Ima onwe onye dị

Na nkebi nke mbu anyị, anyị tulere ozi dị mkpa banyere ihe omume mmadụ bụ na ihe kpatara na ntụpọ mmadụ nwere ike ibelata ikike onye ahụ nwere iji too ma mepe dị ka ụmụ mmadụ. Ntụpọ omume bụ otu ihe n’ime ihe kpatara anyị anaghị enwe obi aṅụrị. Ọ bụrụ na n’ihi akara aka mmadụ, onye ahụ ga-enwerịrị ihe mgbu, mgbe ahụ ntụpọ omume bụ otu n’ime isi ihe nke anyị na-esite na ya enwe obi enweghị aṅụrị. Nke ka dị mkpa maka ndị na-achọ uto ime mmụọ n’ezie bụ na ntụpọ omume nwere ike siri ike igbochi ikike ha iji too n’agbanyeghị ụzọ ime mmụọ nke ọ bụla ha nwere ike iso. Mgbe mmadụ enwere ahụike uche na nguzosi ike (ya bụ nwere obere ntụpọ omume) ọ dịịrị ya mfe inwe ọganihu ime mmụọ ngwa ngwa ma nweta ụdịrị omume ana achọ site na ime omume ime mmụọ.

2. Gịnị bụ ima onwe onye?

Onye ọ bụla raara onwe ya nye imezi onwe ya, mmepe onwe ma ọ bụ ebumnuche dị elu nke uto ime mmụọ chọrọ ichọsi ike ighọta onwe onye. Nke a bụ naanị mgbe mmadụ ghọtara ebe ọ na-eri mperi, ka o nwere ike itinye mbọ ha na ihe ọ ga-eme ka ọ ka mma.

Nkọwa banyere ima onwe onye:

  1. Ima onwe onye bụ ikike nke mmadụ nwere inyocha onwe ya.
  2. Ọ gụnyere inwe nghọta nke na ịhụta ike nke onwe, agwa ọma, adịghị ike, ntụpọ, echiche, nkwenye, ihe kwesiri ekwesi, nzaghachi, mmeghachi, omume, mmetụta na mkpalite.
  3. Ya bụ inyocha onwe gụnyekwara itụle otu ndị ọzọ si aghọta onye ahụ na
  4. Etu ndị ọzọ si enwe mmetụta dabere na omume mmadụ, nzaghachi na omume.

Ndị ọka nmụta n’akparamagwa mmadụ na-ekewakarị ụdị ima onwe onye ụzọ abụọ dị iche, igwe mmadụ ma ọ bụ nzuzo.

  1. Onwe onye ọha na eze maara: Ụdị a na-apụta mgbe ndị mmadụ maara etu ha si egosi ndị ọzọ onwe ha. Onwe onye ọha na eze maara na-apụtakarị n’ọnọdụ mgbe ndị mmadụ nọ n’etiti nlebara anya, dị ka mgbe ime ihe ngosi ma ọ bụ na-ekwunyere ndị enyi ha okwu. Ụdị ima onwe onye nke a na-akwanyekarị ndị mmadụ na-ịnọgide na iwu ọha na eze. Mgbe anyị maara na a na-ahụ ma na-elele anyị, anyị na-agbakarị mbọ ime dị ka ọha na eze si nabata ma chọọ. Na nkenke, anyị na-egosi omume anyị kachasi mma, nke anaghị egosi n’ezie ụdị mmadụ anyị. Ima onwe onye nke ọha na eze nwekwara ike ikpata ‘nyocha nchegbu’ nke na-eme ka ndị mmadụ na-enwe ahụhụ, nchegbu,ma ọ bụ na-atụ ụjọ maka etu ndị ọzọ si ahụta ha.
  2. Ima onwe onye nke nzuzo: Ụdị a na-eme mgbe ndị mmadụ maara ụfọdụ akụkụ nke onwe ha, naanị n’ụzọ nzuzo. N’ịmaatụ, ihụ ihu gị n’inyo bụ ụdị ima onwe onye nke nzuzo. Inwe metụta n’ime afọ mgbe ị chọpụtara na I chefụrụ ịgụ akwụkwọ maka ule dị mkpa ma ọ bụ na-enwe mmetụta n’obi mgbe I hụrụ onye na-amasị gị bụkwa ọmụmaatụ dị mma nke ịma onwe onye na nzuzo. Ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị bụ ụfọdụ akụkụ nke nzuzo onwe anyị dị ka anyị na-ewetụ ihe nchekwa anyị n’ihu nke ha. N’ihi ya ha aghọrọ ihe enyemaka bara uru n’inyere anyị aka inyocha onwe anyị.

Dị ka anyị na-eme omume nke imatakwu onwe anyị na otu ndị ọzọ si ahụta anyị, anyị na-amụta ọtụtụ ihe ndị ọzọ banyere njirimara anyị na ọkwa nke nkeji. N’ihi ya anyị nọ n’ọnọdụ ka mma iji merie ntụpọ omume anyị ma na-aghọta ebe ike anyị dị. N’nkeji na-esonụ, anyị ga-eleba anya na ụfọdụ ụzọ mmadụ nwere ike ịbawanye ịma onwe onye.

3. Otu esi abawanye ịma onwe onye – Site na ile onwe onye anya

Iji ghọta ụdịrị mmadụ anyị, anyị chọrọ ịghọta ọdịdị nke uche anyị. Uche nwere akụkụ abụọ – uche a mara na uche a na-amachaghị. Uche a na-amachaghị bụrụ nnukwu ibụ ma echiche elichiri n’ime ime ya adịghị mfe mkpụghe ma kọwa. Otu ọ dị, mgbe ọ bụla kwa ụbọchị uche mmadụ na-abọpụta ma na-emeghachi n’ụzọ na-adịghị mma nyere ihe omume na ọnọdụ ụfọdụ. N’ihi nke a, mmadụ na-enwe mmetụta ezughị ike na mmetụta dị ka enweghị ntụkwasị obi, egwu ma ọ bụ iwe. Ọtụtụ n’ime anyị na-asụnye onwe anyị na ime ihe anyị kwa ụbọchị ndụ anyị na-enweghị oge iji cheretụ ma chebaa echiche n’ime onwe anyị dị ka gịnị kpatara anyị ji nwe mmetụta na mbu. N’ezie, site na ụdị ọnọdụ ahụ na ebe ibi ndụ ụbọchị niile, uche mmadụ, site na mmeghachi adịghị mma n’ọnọdụ na ihe omume na-emeghe oghere ma nye mmadụ oghere n’ime ọdịdị ya. Ọ bụrụ na mmadụ mụ anya ma na-ahụta ihe na akụkụ niile, onye ahụ nwere ike isonye n’ụzọ site na oghere nke uche na-emeghe. N’ihi nke a, site na usoro a mmadụ na-amalite inwe nnkwu ịma onwe onye dị ka etu uche mmadụ si arụ ọrụ na etu o si azaghachi nkpalite dị iche iche. Nke a ka amara dịka nnkwu-mmata, nke pụtara inwe ọmụma na nghọta nke usoro uche onwe onye. Ụdị mmepe nke onwe a gbasara mmadụ inwe mmata nke ahụ onwe ya na ọnọdụ uche ya gụnyere echiche, omume, ebumunuche, mmetụta na mmekọrịta ya na ndị ọzọ.Ya mere ọ bụ ụzọ mbu na imeri mmetụta na mmeghachi adịghị mma.

Mmadụ n’ozuzu na-enye nzaghachi adịghị mma na omume n’ihi echiche nke ntụpọ omume dị na uche amachaghị.

Ima onwe onye bụ usoro mbu na mmepe omume mmadụK’anyị were ọmụmaatụ. Annette nwere mmetụta ezughị ike mgbe onye isi na ụlọ ọrụ ya toro onye ọrụ ibe ya. Ọ gara n’ihu na-eche maka nke a n’ụbọchị ahụ niile nke bawanyere obi ezughị ike ya. Echiche adịghị mma ‘onweghị ụdị mbọ siri ike mụ na-agba, a na-ahụta mụ’ riri ya ahụ. Na nkenke ụbọchị Annette agaghị nke ọma. Mgbe ọ rahụrụ chara ụra abalị dị mma, O chefụrụ ya ma biwe ndụ ya. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na Annette nọgidere na mmetụta nke obi ezughị ike ma chebaa echiche na onwe ya banyere ihe kpatara o ji nwe mmetụta ahụ, ọ gara inwe nleba anya n’ime uche ya ma ghọta ụdị ntụpọ omume nke ya na-egosi nke na-akpata ezughị ike ahụ. Ya bụ, n’oge ọdịnihu ọ ga-enwe ike na-ama mgbochi nsogbu iji gbochie ezughị ike nke ụdị omume ahụ ma nweta nkwụsike.

Ka Annette na-emewanye nchekwube ichebara banyere mmetụta na mmetụta echiche ya n’ụdị ọnọdụ dị otu ahụ, a ga-enwe nkebi dị n’ihu iji mara onwe ya karịa. N’ịmụmaatụ,

  • Ruo ole mgbe ka enweghị ezumi ike ya ga-adị tupu ọ hụta ya?
  • Ọ ga-enwe ike mgbe ahụ ịkwụsị ya ma jikwa mmetụta nke enweghị ezumike?
  • Ọ na-agba mbọ ịbanye na onwe ya ma mụtakwu ihe gbasara onwe ya na ntụpọ omume ya?
  • Kedu ebe ọzọ ụdị enweghị ezum ike a na-adị? Kedu ndị ọzọ so na ya?

4. Otu esi eme ka ima onwe onye bawanye – Onye na-enye anyị nzaghachi ma ọ bụ na-agwa anyị ihe anyị mehiere

“Gbadata egwu ahụ Raul”, Nna Raul tiri n’olu ike. “Enweghị oge udo na ụlọ a ma ị ga-n’ihu na-akpọ ụda egwu otu ahụ” Rual kpọrọ iyi n’obere olu ma were ike gbatuo ụda egwu ala. Ọ dịghịnata mfe inara nzaghachi adịghị mma n’aka ndị ọzọ banyere omume anyị ma ọ bụ ndụ anyị. N’oge dị etu a, echiche dịka, ‘kedu ihe bụ na ha enweghị ike ighọta m’, ‘Adịghị m otu ahụ’ na ‘Achọghị m ịnụ maka ya’ ga na-aga n’uche anyị. Ka e were ya na Rual kwụsịrị nwa oge ma lele ọnọdụ ọfụma, ọ gara ịmụta otu ihe ma ọ bụ abụọ banyere otu ndị ọzọ si ahụta ya. Mgbe ndị ọzọ nyere anyị ụfọdụ nzaghachi otu ọ bụla osi dị, ọ na-enye anyị mkpụghe etu ndị ọzọ si ahụ anyị. Ọ bụrụ na mmadụ enwetanugo ihe mgbu n’ihi omume anyị, ọ bụkarịrị n’ihi ntụpọ omume dị n’ime anyị ka ndị ọzọ ji enwe metụta ọjọ.

5. Otu esi abawanye ima onwe onye – ịhụta mehie onye ọzọ, bịa chebaa echiche n’onwe onye

Ima onwe onye bụ usoro mbu na mmepe omume mmadụJermy na Ruth na-arụrịta ụka maka ọrụ ezi na ụlọ. Ruth ekweghị na Jeremy na-arụ ihe o tosiri ịrụ ebe Jeremy gara n’ihu na-enye nkọwa enweghị isi banyere ihe kpatara o nweghị ike ịrụ ọrụ ezi na ụlọ n’oge. Mgbe enyi ha Mark nụrụ nrụrịta ụka ha, ọ chọpụtara na ya dị ka Jeremy. Ugbu a dị ka onye nke atọ na-anaghị enwe metụta uche, Mark nwere ike lele ọfụma were hụ na nkọwa Jeremy dị ka nke ụmụazị na na-ọdanyetaghị, na ọ na-ekewapụ nwunye ya Ruth. Ịhụ metụta nke a, Mark were uche kpebie imeri ume ngwụ nke ya ma nyere nwunye nke ya aka n’ụlọ na-enyeghị nkọwa ọ bụla.

Nke a bụ ọmụmaatụ nke mgbe mmadụ hụrụ ọnọdụ nke gbasara ndị ọzọ, onye ahụ enweta nnukwu nghọta nke onwe onye. Dịka onye ahụ anaghị enwe metụta uche n’ọnọdụ ahụ, onye ahụ nwekarịrị ike ichigharị uche ọfụma, ya bụ na ikike iji mụta ihe dịkarịrị.

6. Nrọ anyị nwekwara ike ịgwa anyị maka onwe anyị

Oge ụfọdụ echiche siri ike n’ime uche a na-amachaghị na-apụta na nrọ anyị ganye na anyị nwere ike icheta nrọ ahụ, ma ịmụtakwa ihe maka uche anyị. Otu onye na-achọnụ rọrọ nrọ ebe ụjọ na-atụ ya tupu ọ ga na ama iji nye nkụzi. O tetara hụụ onye ha na ọsụsọ, o nweghịkwa ike ilaghachi rahụ ura gafee otu elekere. Ụdị nrọ a dị mma ichebara echiche dịka ha nwere ike na-atụ aka na nnukwu ihe n’ime uche ana-amachaghị.

7. Na nchịkọta

  • Imata onwe onye bụ ụzọ nke mbu na-imeri ntụpọ omume.
  • Enwere ike inweta ọmụma onwe onye site na ilele mmehie nke onwe, ịjụta ndị ọzọ nzaghachi ha, ilele mmehie ndị ọzọ ọfụma na site na nrọ ụfọdụ.
  • Mgbe ọ bụla mmadụ na-enwe mmetụta uche na-agbanwe agbanwe, ezughị ike,ma ọ bụ obi erụghị ala onye ahụ ga-eke nkwụcha dịka ichemie echiche, ọ na-enyekarị ihe nhụta banyere ụfọdụ ntụpọ omume nke a kpalitere.
  • Anyị kwesiri ịdị njikere iji mụta maka onwe anyị ma kwusie ike iji nara nzaghachi n’aka ndị ọzọ. Site na nke a anyị ga-enwe ike ịkọwa ọfụma mmehie anyị ma nweta ihe omume iji gbanwe maka ọ dị mma.