Usoro nkewa nke mmejọ

Usoro nkewa nke mmejọ

1. Nkewa mmejọ n’ụzọ buru ibu

N’isi okwu a, anyị tụlere etu anyị si kewa mmejọ n’ụzọ buru ibu. Enwere ike ikee ha n’omume na-adịghị mma na mmeghachi na-adịghị mma yana ngwakọta nke omume na mmeghachi omume adịghị mma. Ka anyị leba anya n’ihe atụ ole na ole n’akụkụ nkewa ọbụla nke mmejọ.

1.1  Omume adịghị mma

Nke a bụ ebe n’ihi ntụpọ omume ndị mmadụ, anyị na-eme ihe adịghị mma. Ihe ndị a bụ ụfọdụ ihe atụ nke omume adịghị mma.(ezighi ezi) :

  • John akpachapụghị anya debe ihe ya n’ọnọdụ ziri ezi ma n’ihi ya dofụo ederede ya .
  • Sheela na-aghọ aghụghọ n’ule ya.
  • Fernado na-kụ nwunye ya ihe mgbe ọ ṅụfere mmanya oke lọta site na ụlọ mmanya.
  • Marco na-aṅụ mmanya na-anya ụgbọ ala ga kụtuo onye ji ukwu aga.
  • Shashank na-egbu oge na-agba egwuriegwu vidio mgbe o kwesịrị ịmụ akwụkwọ maka ule ya.
  • Julian ji Adrian eme ihe ọchị iji wetụo ya ala ka e wee ahụta ya onwe ya ka onye ọma n’etiti ndị enyị ha.
  • Chan nwere mmetụta ụme ngwụ iji sachaa efere dị n’ime ebe a na-asacha ihe

1.2  Mmeghachi adịghị mma

Nke a bụ ebe anyị na-emeghachi omume adịghị mma gbasara ihe omume, ọnọdụ ma ọ bụ mmadụ.

  • Mgbe ịkwụ n’ahịrị ịnata ikike ilele onyonyo anaghị aga ọsọ ọsọ Selma enweghị ndidi ma na-enwe ahụ mgbakasi.
  • Mgbe di ya enyeghị ya nsọpụrụ, Xiu Mei nwere nnukwu mmetụta, anya mmịrị jụrụ ya anya.
  • Mgbe nna Tony enyeghị ya ego aka ịkpa ọzọ, o were nnukwu iwe..
  • Mgbe Samantha na-eje ime ihe ngosi na ọgbakọ ụbọchị ahụ niile tupu ihe ngosi ahụ afọ na-alọ ya mmịrị, ụjọ ji ya.
  • Mgbe Ali dara ajụjụ ọnụ maka ọlụ, o bidoro ịnwe obi nkoropu banyere ọdịnihu.
  • Mgbe Sunita nụrụ na nwa ezigbo enyị ya mere ọfụma n’ule ya, o nwere ekworo dịka nwa nke ya mekwara ọfụma na otu ule ahụ.

1.3 Omume ezighi ezi na mmeghachi (ngwakọta)

Ebe a anyị na-eleba anya na ngwakọta nke omume ezighi ezi na mmeghachi na otu ọnọdụ:

  • Mgbe onye ọkwọ ụgbọ ala gbabara n’ihu Ronaldo n’etiti okporo ụzọ ama, Ronaldo tigara ya mkpu n’iwe.
  • Mgbe enyị nwanyị Antonio jụrụ ya obi dara ya mba, ọ gara n’ụlọ mmanya ṅụfee mmanya oke.
  • Mgbe Vladimir chọpụtara na onye ọkwọ ụgbọ ala ghọrịrị ya, o bidoro kparịa ma kụọ onye ọkwọ ụgbọ ala ihe.
  • Ka ọ na-arụ dị ka nwaodịbo na ezi na ụlọ onye ọgaranya, Maria hụrụ ego dị na okirikiri ahụ. Anya ukwuu jidere ya, ka o legharịrị anya hụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o tịnyere ego ahụ na akpa ya.
  • Mgbe a gwara Heinrich na onye na-ere nrị enweghị ike ịnye ya nrị ọchọrọ, o were iwe ma kpọrịa ndị mmadụ.
  • Mgbe nna Amara bara ya mba, o nwere mmeghachi ma kpọchị bịdo onwe ya n’ime ụlọ ya ụbọchị ahụ niile.

2. Na nchịkọta

  • Ọ dị mkpa ima mgbe e mere mmejọ na ịmata ma ọ bụ omume, mmeghachi ka ọ bụ ngwakọta ha abụọ.
  • Site na idetụ mmejọ e mere, ọ na-enye aka n’usoro nke ịmata onwe onye.