Na-edepụta ihe gbasara onwe onwe – Otu esi ede ihe mmehie

Na-edepụta ihe gbasara onwe onwe - Otu esi ede ihe mmehie

1. Okwu mmalite idepụta ihe gbasara onwe onwe

N’isiakwụkwọ bu nke a ụzọ, anyị tụlere ụfọdụ ọmụmatụ nke mmehie na otu enwere ike isi hazie ha. N’isi akwụkwọ a, anyị ga-eleba anya na-idepụta ihe ( ya bụ mmehie) gbasara onwe onye na otu esi ede/depụta ha.

Iji malite usoro mwepụ ntụpọ omume mmadụ, nwaa ma dee mmejọ ndị ị matara ma ọ bụ mmejọ nke onye ọzọ nwere ike ịgwa gị maka ihe dị ka ụbọchị asaa ruo ụbọchị iri. Nke a nwekwara ike ịgụnye mmejọ nke gị onwe gị nke ị ga-amata mgbe a na-atụle mmejọ nke onye ọzọ na ị na-echekwa na I mere ụdị ihe ahụ. Site na ịdekọ ihe ndị anyị mejọrọ, anyị bụ n’ezie na-anakọta ihe gbasara onwe anyị ka anyị wee nwee ike nyochakwuo ụdị mmadanyị bụ. Na mbido mmata banyere ebe anyị na-aga dị ntakịrị ma ọ bụ na-anyị enweghị mmata ma ọlị, ya mere anyị nwere ike ịnara enyemaka ndị ọzọ. Mgbe ihe dị ka ụbọchị iri gachara, mmadụ ga-amata ụdị mmehie na-eme emekwasị na nke a na-enyere mmadụ aka ịghọta ihe ọ ga- arụ.

2. Kpọọ okwu aha mgbe ị na-ede mmejọ

Mgbe ị na-ede mmejọ, ọ dị mkpa ka mmadụ mụta ka esi ede mmejọ n’otu nkọwa ma dịkwa mfe ka o wee doo uche anya ebe mmadụ gahiere ụzọ.

Ọ bụ ihe dị n’uche ichebe onwe ya. Ọ bụ  n’ihi nke a uche mmadụ na-anwa izochi mmejọ ma ọ bụ dobe ya n’ọnọdụ mgbagwoju any aka mmadụ ghara inweta enyemaka ebe mmadụ kwesịrị imeziwanye. N’ihi ya, uche na-agbagha ma duhie mmadụ ma na-agba mbọ ime ka mmetụta ahụ bụrụ na ‘Eziokwu m’ Ya mere, ka ọ dị nkenke ma dokwuo anya mgbe mmadụ na-ede mmejọ ya, ọ ka mma.

Ka anyị leba anya n’ịmaatụ nke otu ụzọ nke ide mmejọ ezighị ezi.

“Tata a bara m ụmụ m mba ọtụtụ oge. Ha anaghị edebe ihe ọbụla ọcha. Agbanyeghị ole m gwara ha, ha anaghị amụta. Anọ m nkwụsi ike tata. Akparamagwa Ana na-enyewanye nsogbu. Ọ na-achọkarị ihe ọhụrụ oge niile. Dị ka nne, ana m agbalị imezi ihe, mana ihe ndị ọ chọrọ anaghị ebelata. Nsogbu m bụ na ọ bụrụ na m mee ihe ọ chọrọ , ọ gaghị aghọta uru ihe ọ na-enweta. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na m emeghị ihe ọ chọrọ, ụmụaka ahụ nwere ike ịdị na-eche na ndị mụrụ ha anaghị akwado ha. Amara m na ọ bụ oge na-agafe agafe mana n’oge ahụ a ga m eti mkpu.”

Inwere ike ịchọpụta na n’ime mmehie a, e nwekwara ọtụtụ akụkụ akpọtụrụ ya bụ ọ karịrị uche. Ọ ka mma ide otu akụkụ n’otu oge na-enye anyị nsogbu ma ọ bụ na-akpasu anyị iwe. N’okwu a, e nwere mmejọ abụọ.

Yabụ n’ihe banyere ịmaatụ a dị n’elu, ihe ndị a ga-abụ ụzọ kachasị dị ire iji dee otu mmehie.

1. Mgbe Ana (nwa m nwanyị) na- ehichaghị iko ya na-agbanyeghị na m na-echetara ya, iwe were m na ebe ọ nọ.

2. Mgbe Ana (nwa m nwanyị) gwara m ka m zụtara ya akpụkpọ ụkwụ dị oke ọnụ, enwere m mmeghachi omume na ọ bụrụ na m na-eme ihe ọ bụla ọ chọrọ n’oge ọ bụla, ọ gaghị eji m kpọrọ ihe ma chee na ihe niile na-adị mfe.

N’okwu nke mbu, ọ ga-esiri mmadụ ike ịkọwapụta otu ihe bụ isi okwu. Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike ịkọwapụta isi okwu nyere amamihe ya, mgbe ahụ enwere obere ohere na mmadụ ga-enyocha mmejọ ahụ ma ọ bụ nweta enyemaka ọbụla na ya. Iji tinye ruo uche na ihe kpatara nsogbu/mmeghachi omume, ọ dị mkpa ịkpọ okwu aha. Site n’ikewa ihe niile merenụ n’ime obere mmejọ wee dee ya ka uche na ọgụgụ isi wee mata nke ọma ebe mmadụ na-agahie, ọ na-enyere aka ịchọpụta ntụpọ kpatara mmejọ ahụ.

3. Ka nlekwasị anya di na onwe onye

Mgbe ụfọdụ mmadụ na-amata na o mehiere site na mmeghachi omume n’ebe onye ọzọ nọ. Otu ọ dị, otu akụkụ uche ha na-eduhie ha ikwenye na o ziri ezi n’inwe mmeghachi omume ahụ. N’otu aka ahụ mgbe  onye ahụ na-ede mmejọ ahụ, onye ahụ na-ede ya n’ụdị  ga-ewepụta mmejọ zuru ezu nke onye ọzọ. Nke a na-eme ka mmadụ na-elekwasị anya na mmehie onye ọzọ megidere ịdị na-eche echiche banyere ihe mmadụ mere na ihe ahụ merenụ.

Ịmaatụ – mmejọ edeturu n’ụzọ ezighị ezi nke na-elekwasị anya na mmejọ nke onye ọzọ

Di m Jimmy na-abanye n’ekwenti ya oge niile, O naghị enye m oge. Taa o mekwara ọzọ. Achọrọ m ka m na ya kwurịta okwu ole na ole ma ọ sị na ya ga-ewe obere oge ma ọ nọgidere na ekwentị ya ma meek a m chere.Echere m na ọ bụ mkparị na agwa na-adịghị mma n’akụkụ ya ya mere e were m iwe.

Ịmaatụ – mmejọ edeturu n’ụzọ itinye uche n’ihe karịa

Iwe were m na ebe di m nọ mgbe m tụrụ anya na ọ ga-enye m oge ka ọ nọ na ekwentị ya.

Dị ka Ị na-ahụ ndegharị mmejọ ga-eme ka mmadụ na-etinyekarị echiche n’ihe. Ọ na-abụ ihe nkpalite maka mmadụ ịjụ onwe ya ajụjụ. Mgbe ahụ mmadụ ana-eche n’ụzọ na-esote,

“Ok Jimmy ji ekwentị ya n’ọrụ mana kedu ihe kpatara o ji emetụta m  nke ukwuu? Ebe ọ bụ na m agwaghị ya tupu ugbu a. Enweghị nkwukọrịta ụka nwere ike ịbụ nsogbu ya mana iwe na-ewe m bụ naanị iru uju. Ọzọkwa e chere m na ihe m ga-ekwu banyere ya bụ ihe dị mkpa karịa ihe ọ na-eme. Kedu ka m ga- esi meek a iwe m dajụọ?”

4. Dee mmejọ ahụ n’eziokwu

Na-eji okwu na-ezighị ezi

Mgbe ụfọdụ anyị chọpụtara na mgbe ndị na-achọnụ na-ede mmehie ha ha na-atụkwasị okwu ụfọdụ na-ebelata ike mmehie ahụ. N’ọmụmaatụ, Otu onye dere mmejọ ya n’ụzọ na-esote.

“Mgbe Joanne kparịrị m n’ihu ndị ọrụ m, iwe were m obere, ọ dị m ka m zaghachi ya ihe”

N’ezie ezigbo iwe were ya nke ukwuu mana ọ chọghị ịkweta na o metụtara ya nke ukwuu. Ọzọ ihe ọ chọrọ  ime bụ ịkparị ya n’ihu ndị enyi ya iji kuziere ya ihe. Ya mere ọ gara ịka mma ma ọ bụrụ na o dere mmejọ ahụ n’ụzọ nke a.

“Mgbe Joanne kparịrị m n’ihu ndị ọrụ m  iwe were m nke ukwuu, enwekwara m nnukwu igba ume siri ike mkparị ya n’ihu ndị enyi ya”

Ọ ka mma ịghara iji okwu dịka “ntakịrị” ma ọ bụ “obere” na njikọ ntụpọ omume. Nke a bụ n’ihi na ọ na-eziga ozi na-ezighị ezi na uche na ọgụgụ isi ya na ọ bụghị ihe ọjọọ mgbe niile.

Ikweta ntụpọ maka onwe onye

Ọtụtụ oge ọbụladị ndị na-achọnụ nwere ike isiri ha ike ikwenye n’onwe ha na ha nwere ụfọdụ ntụpọ nke omume. N’ịmaatụ, ọ dị mma ikweta na mmadụ na-eburu di ya iwe n’ihi na nke a bụ ihe na-eme ebe nile. Otu ọ dị, ọ na-esikwu ike ikweta na mmadụ na-enwe anya ụfụ ma ọ bụ ekworo n’ebe onye na-achọnụ ọzọ nke e toro n’ọgbakọ nke ezi okwu.  (Satsang) maka mbọ ya. Ntụpọ dị ka anyaụfụ, ekworo, anya ukwu na agụụ ihe ọjọọ bụ ihe siri ike karịa ikweta ịnwe umengwụ, enweghị atụmatụ, enweghị ezi ọrụ na ndị ọzọ ga.

Mgbe ụfọdụ mkpa ọ dị iji ichekwaa onwe gị dị ukwuu nke na mmadụ agaghị edetụ mmehie dị otu ahụ n’agbanyeghị na ha maara ya.

5. Ndụmọdụ ndị ọzọ iji mee ka odide mmehie dị mfe

Na-edepụta ihe gbasara onwe onwe - Otu esi ede ihe mmehie

  • Ịnwe obi, idoanya, ịdị mfe na ikwụba aka ọtọ bụ isi ihe ị ga-ebu n’uche mgbe ị na ede mmejọ.
  • Ọ bụrụ na otu mmehie na-eme ọtụtụ oge n’otu ubochị – mmadụ nwere ike idetụ mmehie ahụ  otu ugboro makwa gụọ ọnụ ugboro ole o mere iji ghọta ịdị njọ ya.
  • Gbalịa ịdị na-edetụ mmehie mgbe niile. I nwere ike iji ndebiri mpempe akwụkwọ agbasara iji dee mmejọ gị. Kọlụm B na mpempe akwụkwọ ọrụ ‘Mmehie m’ bụ ebe ị ga-achọ idetụ mmehie ịhụrụ ya na ụbọchị  na kọlụm A. Isi okwu nke a niile bụ banyere otu a ga-esi debanye ihe na kọlụm B nke mpempe akwụkwọ PDR.
  • Mgbe ụfọdụ mmadụ nwere ike inwe echiche ngabiga nke ekworo ma ọ bụ mpako. Mmadụ kwesiri idetu ya ebe ahụ na mgbe ahụ, dị ka mmadụ nwere ike ichefu ya na njedebe ụbọchị mgbe mmadụ na-anọdụ ala ide mmehie ya.
  • Debe ihe oge niile iji dee mmehie gị, ma ọ bụ mkpịsị akwụkwọ na akwụkwọ ma ọ bụ ama ngwa ihe ndetu ekwentị.
  • Sonye na satsang (Nsonye n’eziokwu zuru oke) nke SSRF n’ihi na ọ ga-enyere gị aka ịmatawu ihe a na-ewere dị ka mmehie, otu a ga-esi lezi anya ịchọpụta mmehie na otu esi ede ha.